Onye nsoso: Ihe Liverpool mere wuterem ọfụma

Alex Sanchez

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Alex Sanchez so na ndi aha zụrụ ụyahụ

Ka mgbe emechịrị ahịa orire na ọzụzụ ndị egwuregwu bọọlụ ụnyahụ, ọtụtụ mmadụ hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya ekwuola ihe dị ha n'obi gbasara ihe mere na ya bụ ahia.

Niran Adesanya bụ onye nta akụkọ egwuregwu gwara BBC Igbo na ahịa ụyahụ gara nkeọma.

"Olivier Giroud gara Chelsea enweela isi ọma. Chelsea nwekwara uru na ahịa nke a, makana ha zụrụ Giroud na nde pounds ịrị na asatọ," Adesanya kwuru.

Lucas Moura

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lucas Moura a ga la Tottenham

O kwukwara na"Ego e ji zụ Aymeric Laporte dị ọnụ n'uche m". Ego e ji zụ Van Dijk garakwara ọnụ"

Mana ọbi adịghị Stephen Mbonu mma. Ọ bụ onye n'ahụ Liverpool n'anya. Mbonu kwuru na "kedu ka Liverpool ga esị re Philippe Coutinho mgbe a mara na onweghị onye ọzọ ga nọ chi ya. Ugbua, otu Liverpool akwụsịghị ike maka anyi ezurezu"

Mesut Ozil

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mesut Ozil ebinyeela aka n'akwụkwọ rue afọ 2021

Mana Tony Chinenyelum bụkwa oye nso nso Manchester United gwara onye nta akụkọ anyi na "e chekwudo m oge ahịa ọzọ, otu nkem bụ Man U ga-zụ Ronaldo makana onye isi anyị bụ José Mourinho bụkwa onye n'eme ihe itụ anya"

Ahịa egwurugwu bọọlụ mechịrị na abali ụnyahụ.