NYSC Allowance: Gịnị ka ị ga-ejinwu N19,800 mee?

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị ka ị ga-ejinwu N19,800 bụ ego 'allowee' a na-akwụ ndị na-efe ala nna otu afọ mee?
#NYSCAllowance malitere iwu na soshal midia ka ndị mmadụ, ọkachasị ndị ferela ala nna ha n'oge gara aga, ji ya na-eme ihe ọchị.
Ọtụtụ n'ime ha kwuru na ego ahụ pere oke mpe ịkwụ ndị mmadụ.
Mana BBC Igbo chọrọ igosi gị uru ole na ole ego a nwere ike ịbara gị.
Uru 19,800 bara
1) Ị ga-ejinwu ya zụta ihe Bekee kpọro 'data', ma were ya bụ data na-ere ahịa n'elu soshal midia.

Ebe foto si, Getty Images
2) Ị ga-ejinwu ya bido ahịa ọkịrịka, ebe ọ ga-abụ ị zụta akwa e yiri eyi n'ọnụ ala, i tinyetụ ya ego ma regharịa ya.

Ebe foto si, Getty Images
3) Ị ga-ejinwu ya bido ahịa ngwa ekwentị dị icheiche.

Ebe foto si, Getty Images
4) Ị ga-ejinwukwa ya kpọrọ ndị enyi gị maọbụ ezinaụlọ gị taa nkwọbi na isi ewu ma were ezigbote mmanya ngwọ butuo ya.

Ebe foto si, Ntanta Delicacies/Mazi Nwonwu
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ego alawi
@Rouvafe kwuru na ego alawi ga-ezu ịzụta naanị ji abụọ nakwa obere ihe ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@Stkeypoint kwuru na ị kwụ onye na-efe ala nna ya N19,800 dị ka ịchọrọ onye arịrịọ obere ego.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@degosTee na-ajụ etu N19,800 ga-esi ezuru ndị mmadụ igbo mkpa ha n'otu ọnwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Akụkọ ndị ga-amasị gị











