Asambodo NYSC ọ dị mkpa n'inwe ọkwa ọha na Naịjirịa?

Ebe foto si, AFP
Onye ọbụla a họpụtara maka ọkwaọha na Naịjirịa kwesiri inwe ụfọdụ ihe tupu ha abanye ọkwa ahụ n'ezie.
Ọ bụrụ na ọ bụ ọkwa minista, iwu Naịjirịa kwuru na onye ahụ ga-enwe opekatampe, asambodo ụlọakwụkwọ sekọndrị dịka onye nọ n'ọkwa ụlọomeiwu.
Agbanyeghị iwu gbasara asambodo, o nwere iwu ndị ọzọ mmadụ ga-agafe tupu ha malite ị bụ minista n'obodo Naịjirịa.
Ka o si aga

Ebe foto si, AFP
Mgbe aha mmadụ pụtara dịka minista ala Naịjirịa, onyeisiala họpụtara ya ga-ebuzo zie ozi ka e mee nyocha nke gbasara nchekwa.
Ndị ga-eme nyocha a bụ ndị uweojii pụrụịche na-ahụ maka nchekwa ndị nọ ọchịchị a kpọrọ SSS n'aha ịchafụ. Ha ga-ekwu n'ozuru oke tupu onye ahụ aga n'ụlọomeiwu
E rue n'ụlọomeiwu, ụlọ nke ukwu bụ Sineti ga-emekwa nyocha nke ha ma jụ kwa onye ahụ ajụjụ ọfụma tupu a nabataya dịka minista ala Naịjirịa.
NYSC ọ dị mkpa?
NYSC bụ usoro ofufe ala Naịjirịa ehibere kamgbe afọ 1973 iji chịkọta odinotu ala Naịjirịa. E hibekwara iwu ga-ekpuchi omume ha n'afọ 1993 n'okpuru ọchịchị Ibrahim Babangida.
Ọ bụ ndị gụchara mahadum maọbụ nwete ihe yiri asambodo mahadum n'ọgụgụakwụkwọ bụ ndị kwesiri ị mee emume a na-eru otu afọ.
Onye okaiwu bụ Kayode Ajulo gwara BBC Igbo na ọ dịghị mkpa ị nwe asambodo NYSC tupu anabata gị dịka Minista ma na onye iwu kwuru na onye ọbụla gụchara mahadum ga-eferiri ala nna site na NYSC.

Ihe iwu NYSC kwuru

Ebe foto si, AFP
Iwu hibere NYSC nke emegharịrị n'afọ 1993 kwuru na onye ọbụla achọghị ị fee ala nna ga:
- A dị ihe karịrị afọ 30 mgbe ọ gụchara Mahadum ọbụla n'elu ụwa niile.
- Abụ onye ritere nturugo gọọmentị ọbụla.
- Abụ onye na-arụ ọrụ nchekwa dị ịcheiche dịka ndị agha maọbụ ndị agha mmiri.
- Na-arụrụ ngalaba dị icheiche a ọrụ: NIA, DIS, SSS, NSO.
- Onye ọbụla dara iwu a ga-akwụ puku naịra abụọ maọbụ gaa nga otu afọ.
Ihe butere okwu bụ na ụlọọrụ ntaakụkọ ebola minista na-ahụ maka akụnaụba ebubo mmerụka asambodo NYSC.
Dịka iwu NYSC kwuru, onye ọ bụla achọpụtara dara iwu a ga-aga ụlọmkpọrọ maọbụ kwuọ puku naira abụọ.
Ajulo kwukwara na ọ dịghị mma ị nye mmadụ ọkwa ọha ọbụla ebe a maara na o nweghi asambodo ziri ezi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










