Ima aha ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuru na aka ha dị na oke ogbugbu na-eme na Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Femi Adesina si na onweghị ihe onwere ikwu gbasara akwụkwọ onye otu ya bụ Garba Shehu depụtara maka nsogbu dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehị.
O nyere usaa a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ taa.
Na mbụ, onye ndụmodụ ukwuu n'ihe gbasara mgbasa ozi n'ụlọọrụ onyeisala Naịjịrịa bụ Shehu Garba deputara okwu a n'akwụkwọ o wepụtara ụbọchị Julaị 8.
N'ime akwụkwụọ ahụ o kwuru na ndị ndọrọndọrọ ọchichị a na-akpọpụtaghị aha ha na-eji ndị ekperima eme oke ogbugbu a.
Shehu kwukwara na mgbanwe ịhụ igwe nakwa nkpọnwụ ''Chad Basin'' sokwa eme ka nsogbu oke ogbugbu a bawanye.
O kwere nkwa na gọọmentị etiti na-agba mbọ n'ịhụ na ya bụ nsogbu nwetere ogbugbo tọrọ atọ.
Shehu rịọkwara ndị Naịjirịa na ndị mba ofesi ka ha kwụsị gbasa ozi ụgha gbasara nsogbu a.
O kwuru na o dimkpa ka ndị na-achị steeti, ndị ọrụ nchekwa, na mba ofesi jịkọta aka gboo mkpa a.
N'ọnụ ya, nsogbu ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ụgbo bụ ihe diwara kamgbe gboo. Ihe na-ebute ya bụ miri emi.''
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia:
Patrick Ibeawuchi kwuru na o chere na onyeisiala kwuburu na ọ bụ ndị oyi egwu Libya na-ebute nsogbu a?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Elisha Bello na-agwa onyeisiala ka o nwuchie ndị a o na-ekwu nwere aka na nsogbu ochiehi na ndị ọrụ ugbo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Shyne na-agwa ụlọọrụ onyeisiala ka ha kwusi ị nye usaa kpatara nsogbu kama ha chọọ ogbugbo ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3









