Buharị akatọọla ọnwụ ndị ụkọchukwu abụọ na Benue steeti

Onyeisiala Naịjiria Buharị

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Buhari kwuru na Naịjirịa agaghi ekwe ka ndị ojoo merie
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala Buharị n'ehihe a depụtara akwụkwọ katọrọ ogbugbu egburu ụkọchukwu abụọ ndị ụka Katolik nke mere n'obodo Mbalom na Benue

O kwuru sị "Obi m dị ebe Bishop na ndị ụka St Ignatius ebe e gburu ndị a nwụrụ, m na-asị ha ndo"

N'ime akwụkwọ a, ọ sị na ọ bụ ihe ọjọọ ị metọ ụlọekpere ndị ofufe ọ bụla.

Cheta na ndị eche na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi gburu ndị ụkọchukwu Katolik abụọ na mmadụ iri na atọ ndị bịara ụka ụtụtụ n' Ayar-Mbalomụka dị n'okpuru ọchịchị Gwer-East na Benue steeti.

Onye nọ ebe ihe ahụ mere nyere aha ndị ụkọchukwu e gburu dịka Rev Fr Joseph Gor na Rev Fr Felix Tyolaha.

Otu onye ọrụ gọọmenti achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC na ọdachi ahụ mere n'ezie.

Ndị ochi-ehi ahụ ji egbe wakporo St Ignatius' Catholic Church, Ayar-Mbalom, n'ụzọ ụtụtụ Tuusde oge ha na-aka ụka.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ndị omekome ahụ nye ndị obodo ahụ ọsọ ma gbakwa ụlọ ruru iri ise ọkụ.

Mwakpọ ahụ na-eme abali anọ ndị a na-eche na ha bụ ndị agha si Naka n'okpuru ọchịchị Gwer gbuchara ndị ọchịehị iri ma mebie ụlọ karrịrị nari atọ n' obodo Guma.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ