INEC ga-akwụsị idenye aha maka akwụkwọ ntuliaka n'ọnwa na-abịa

Ebe foto si, AFP
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ nke a kpọrọ Independent National Electoral Commision (INEC) na Bekee kwuru na ha ga-akwụsị idenye aha ndị mmadụ maka inye ha akwụkwọ ikike iji mee ntuliaka n'ụbọchị 17 nke ọnwa Ọgọstụ afọ a.
Ndị INEC kwuru n'ime akwụkwọ ozi ha zipuru na ha na ndị ọnụ na-eru n'ihe gbasara ntuliaka etinyela ọnu na-etu esi eme ndenye aha maka ntuliaka nke 2019, wee kpebie na ha enyela ohere etu o si kwesị maka idenye aha nakwa ihe ndị ọzọ banyere ịnata akwụkwọ ikike a.
N'agbanyeghi na a ga-akwụsị ime ndenye aha n'Ọgọstụ, INEC kwuru na a ka ga na-anata akwụkwọ ikike a ruo izuụka tupu emee ntuliaka 2019, nke ga-eme n'ụbọchị 16 nke Febụwarị.
BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ maka etu ha si dịrị nkwadobe maka ntuliaka nke 2019 mgbe na-adịghị anya. Lee ihe ha kwuru ebe:
Cheta na ụloomeiwu tinyere ọnụ n'usoro e ji eme ntuliaka na Naịjirịa ga-emegide ndị mmadụ wee chọọ imegharị ya. Gụọ maka nke ahụ ebe a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:








