Otu nwoke agbaala onwe ya ọkụ na ndụ na Legọs

Ọnye chọrọ igbu onwe ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtanisi mere ka ọtụtụ mmadụ na-egbu onwe ha na Niajịrịa

Nwaokorobịa a na-eche na ọ gbara afọ iri abụọ (20) mụnyere onwe ya ọkụ na Omole Phase 1 Legọs.

Nwaamadị a amabeghị aha ya bu mmanụ ụgbọala na mkpaọkụ kọrọ ka ihe isiike sị anyụ mmmadụ ịkpakwụ na Naịjirịa.

Ben Chinedu bụ onye huru nwaamadị a korọ ndị nta akụkọ ka o sị eti mmkpụ ka ọha nụrụ onu ya tupu obie onwe ya ajọ aka ahụ.

Ọ sị na "ndị mmadụ gbakọrọ na geti ebe ahụ mgbe nwaamadị a hapụrụ onu ya aka na-arịọ ka ndị mmadụ gbatara ya ọsọ enyem aka mana onye ọ bụla nyuru ntị mmaụ ma na-akọrọ ya ka ụwa nke ha sị ka njọ".

Ọ kọrọ ndị mmadụ na "obodo a agaghị adị mma ọzọ".

Ọ sị na nwoke ahụ gwara ha na obodo Naịjirịa enweghị mmekwata nke o ji ebụ ụmụnororbịa n'ụche.

Ọ kọrọ ka ike ụwa siri gwu ya maka ọchịeze ndị mmadụ jị ebi na obodo a.

Mgbe ọkwuchara nke a, ọkpara ọkụ mụnye onwe ya na ahụ.

Chinedu sị na ha chọwara mmiri iji gbanyụ ya bụ ọkụ.

Mana tupu ha bia na "ya bụ ọkụ agbaala nwoke ahụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma".

Ha kpọrọ ndị ụweojii ka ha bịa bụrụ ya bụ nwoke.

Mgbe ha jiri bịa, nwaamadị ahụ na uche ya esoghịzị.