Ndị Aba ebidola ịrụ akpati ntuliaka nke Inec

Independent National Electoral Commission (INEC) bụ ụlọọrụ na-ahazị ntụliaka na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Independent National Electoral Commission (INEC) bụ ụlọọrụ na-ahazị ntụliaka na Naịjirịa

A mara obodo Aba kamgbe dịka ebe a na-arụpụta ọtụtụ ihe dị icheiche, mana oge na-adịghị anya ha malitere ị rụpụta igbe ntuliaka ndị Inec.

Mgbe ndị ntaakụkọ gbara onye Gọvanọ ahụ Steeti bụ Okezie Ikpeazu ajụjụọnụ, O kwuru na nke a bụ iji kwalite ngwa ahịa ndị emere n'Aba.

O kwuru na igbe ndị ejiri mee ụfọdụ ntụliaka na Naịjirịa bụ ndị Aba rụrụ ya.

O kwukwara na ndị Inec tụrụ ahịa ka-arụpụtara ha igbe ndị ahụ karịa ị ga mba China tụbata ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Mgbe ndị BBC Igbo gbara onye Kọmishịọna na-ahụ maka Mgbasa ozi na Steeti ahụ bụ John Okeiyi ajụjụọnụ.

O kwuru na ha na-atụ anya ka ndị Inec bịa tụọ ahịa maka igbe a ga-eji mee ntụliaka nke afọ 2019.

Akara ntụ-ntụ

Ihe ọzọ ndị Aba na-arụ:

Ndị Aba ebidola ịrụ akpaụkwụ ndị agha Naịjirịa kamgbe ọtụtụ afọ gara aga.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị Aba ebidola ịrụ akpaụkwụ ndị agha Naịjirịa kamgbe ọtụtụ afọ gara aga.

Okeiyi rụtụrụ aka na oge gara ndị agha Naịjirịa bịara Aba zụọ akpaụkwụ ndị agha ruru puku iri ise (50,000).

O kwukwara na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari zụkwara akpaụkwụ dị puku iri abụọ na ise maka ndị gbara ọsọndụ.

Cheta na onyeisiala nyere iwu nke akpọrọ 'Executive Order No 3' nke kwuru na onye ọ bụla ga na-azụ ngwaahịa ndị emepụtara na Naịjirịa.

Nke a bụ iji kwalite ihe ndị emepụtara n'Aba n'akwa Naịjirịa gbaa gburugburu.

Akara ntụ-ntụ