'Ịkpa isi ka m ji enyere ụmụ nne m na ezinaụlọ m aka'
Akaọrụ bụ otu ihe dị mkpa mmadụ inwe n'obodo iji kwado onwe ya ma nyekwara onwe ya aka.
Ụfọdụ aka ọrụ ka e ji mara ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na mbụ mana ugbua, ọtụtụ ụmụnwoke na-emezi ihe ụmụnwaanyị na-eme dịka ịkpa isi, isi nri wdgz.
Kingsley Isaac nke e ji 'HairbyKings' were mara bụ otu onye banyere n'akaọrụ ụmụnwaanyị nke bụ ịkpa isi ma jiri ya na-emepụta ihe dị icheiche.
Agbanyeghị na ọ na-eme ya n'ụdị pụrụ iche, Kingsley kọwara na ya ejirila akaọrụ ahụ zụpụta onwe ya n'agba mahadum nke mbụ ma na-agakwa nke abụọ.
Nke a gụpụghị enyemaka ọ na-enyere ezinaụlọ ya.
Akaọrụ Kingsley na-atụ n'anya, lee ihe ọ na-emepụta n'onyonyo a:
Akụkọ ndị ga-amasị gị

