Nigerian Customs sị na onye otu ha bịara ụlọọrụ ha n'Abuja ejichaghi uche aka

Joseph Attah bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka ibubata ngwaahịa na Naịjirịa bụ Customs ekwuola uche ya na onye otu ha bịara njem n'ụlọọrụ ha taa ejighi uche ha.
Ọ sị na ọ bụ ezioukwu na onye ọrụ ahụ ndị mmadụ tinyere foto ya na soshal midia yi ọkwa akpọrọ "Deputy Comptroller General" na Bekee wee bata n'ụlụọrụ Customs n'Abuja.
"Ọ bụ eziokwu na ọ bịara, mana ọ bụghị eziokwu na ọ bịara n'ụlọọrụ onyeisi anyị.
"Ka ndị mmadụ hụrụ ya, hụrụ ọkwa o yi n'uwe ya, a gbara ya ajụjụ ọnụ, ma chọpụta, site n'etu o si asa na o jighi onwe ya aka."
Attah sị na ha kpọrọ dọkịnta mgbe a hụrụ n'ihe a abụghị nke ha e meeli.
Ọ sị na onye a nwere ọkwa "Assitant Superintendant" aha ya bụ Dahiru nọ n'ụlọọgwu ugbua."
Ọtụtụ okwu a na-ekwu maka nwa amadị a abụghị eziokwu.
"Ndị mmadụ na soshal midia amachaghi ihe mere. Ha na-ekwu ihe ọbụla ha chọrọ. Onye nke a kwuo nke ya, onye ọzọ e kwuo nke ya."








