Nigeria Customs: Lee nwoke Kọstọm e buliri elu n'ihi na ọ jụrụ ịnara akaazụ

Ebe foto si, Nigeria Customs Service/Facebook
Kọstọms ebuliela otu onye ọrụ ha a kpọrọ Bashir Abubakar maka ịkwụwa aka ọtọ.
Hameed Ali bụ onyeisi ngalaba Customs kwuru na ịgbajọ ego akazụ ahụ gosiri na ihe ga-abara oha mmadụ uru dị Abụbakar mkpa.
Abubakar gbajọrọ ihe ruru puku narị naira anọ n'ọma ndị na-ezobata ahịa chọrọ inye ya iji kwe ka ngwa ahịa ha gafere.
Ha gwakwara Abubakar na ọ bụrụ na ọ mee nke a, ha ga-enye ya ego karịrị nke a.
Abubakar jụrụ ego ahụ ma jichie igbe ahịa riri iri anọ bụ ọgwụ Tramadol abata na Naịjirịa.




