Custom Officer: Etu i kwesiri imeso onye ọrụ nchekwa bu egbe

Ebe foto si, Nigeria Customs Service
Onye ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa bụ Kelechi Eze akpoola oku ka a kpubụ onye ọrụ Kọstom gbagburu mmadụ n'ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya.
Eze kwuru na onye mere ihe ọjọọ kwesịrị ka a kpụrụ ya gaa kpe ya ikpe na ọ bụghị igbagbu ya dịka onye ọrụ Kọstọm mere.
Ihe onyonyo fegharịrị na mbido izuụka a gosiri ebe otu onye ọrụ Kọstọm gbagburu otu nwoke a kpọrọ, Godwin Onajaro, n'okporoụzọ awara awara si Shagamu gawa Benin.
Ngwa ngwa akụkọ ahụ pụtara, ọnụ na-ekwuru ndị Kọstọm bụ Joseph Atta gọpụrụ onye ọrụ ha.
Atta kwuru na ọ bụ ndị njem bu ngwaahịa iwu mabidoro banyere onye ọrụ ha ọgụ nke mere na mgbọ dị n'egbe o bu gbapụrụ tụọ onye nọrọ onwe ya.
Mana ụlọọrụ ụgbọala ahụ bu ndị njem bụ Iyare Motors gwara BBC na ọ bụ ụgha na ha bu ngwaahịa iwu mabidoro.
Onye ọrụ ụlọọrụ ụgbọala ahụ kpọrọ onwe ya Solomon kwuru na "onye ọrụ kọstọm gbara egbe ahụ ṅụrụ mmanya."
Ọ kọwara na ọ bụ okwu ego mere ka ọ gbaa egbe ahụ.
Na nkọwa ya, Eze, onye na-arụ n'ụlọọrụ nchekwa ọ chọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na onye Kọstom kwesịrị ịga nga n'ihi na agwa ọ kpara megidere iwu.
O kwuru na ọ kara anwụchị onye na-ada iwu karịa ịgbabu ya.
Ụmụ Naijiria ndị ọzọ etinyela ọnụ n'okwu ahụ.
Ha na-ebo ndị Kọstọm ebubo ị nọchị ikpemkwụmọtụ sịte na ịzọtara onye otu ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ihe i kwesiri imee ma izute onye ọrụ nchekwa
Eze nyere ọha mmadụ ndụmọdụ atọ etu ha kwesiri imeso onye ọrụ nchekwa bu egbe.
Lee ha:
1. Kwanyere onye ọrụ nchekwa ugwu
2. Ha kwa gị mee ihe, mee ya
3. Ọ bụrụ na i nweghị akwụkwọ, soro ha gaa ụlọrụ ha, i rue ebe ahụ irue ebe ahụ ịgwọ ụgwọ dịka iwu siri kwuo.










