Ihe mere m ji eke ọtụtụ ji m na-akọpụta n'ọba - Elieza Chinedu (Ọkọ ji n'Ani Nri)
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Chukwu Elieza Chinedu bụ nwamadị na-akụ ugbo n'obodo Mpu nke okpuruọchịchị Ani Nri dị n'Enugwu Steeti akọwaala etu o siri malite ọrụ ugbo n'ebe ọpụrụiche.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Chinedu gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka na ngalaba nkụzi azụmahịa, ma gụkwaa n'Oko Pliteknik kwuru na ọ bụ site n'aka nna ya ka o siri mụta ma malite ịkọ ugbo.
"A mụrụ m n'ọrụ ụgbọ, nne na nna m bụ ndị ọrụ ugbo. Mgbe m dị obere, anyị gbasaa ụlọakwụkwọ anyị na-eso nne na nna anyị aga ọrụ ugbo.
"Etu ahụ ka anyị si na-eme ya na-etolite. Anyị na-ahụta ya ka ahụhụ nke mere anyị ji na-agbara ya ọsọ.
"nwere oge ruru, ebe nne m bụ onye nkụzi nna m bụrụ onye ọrụ ugbo, nwanne nwoke soro nne banye n'ọrụ nkụzi, m wee sị na ọ ga-adị mma ka m soro nna m n'ọrụ ụgbọ.
"Nna m kọpụta ihe n'ugbo, o bunye m ka m ree ya n'ahịa, m rechaa ya m chọpụta na ego dị na, m sị na ọ ga-adị mma ka m were ụbụrụ ihe m gụtara n'akwụkwọ tinye n'ọrụ ụgbọ."

Nwamadị gara n'ihu kọwaa etu o si akọ ji n'ebe o buru ibu ma na-ekekwa ya n'ọba.
"Ji nwere usoro e ji akọ ya, ọtụtụ obodo nwere omenala ha jiri akọ ya.
"Etu anyị si akọ ji n'obodo anyị bụ i wepụta ji ị hapụ ya ka ọ taa mmiri, oge e ji akọ ji rụọ, I bewa ji ahụ, ọ bụghị naanị isi ji ka a na-akọ, a na-akọ ma etiti na ọdụ ya. I bewachaa ya ị gaa n'ugbo kọọ ugwu aja ma tinye ya. ọ na-adị mma ka a kọọ ugwu aja (hip) ka o too ogologo maka na ji na-akwụ ọtọ n'ala."


