Ọgbambọ: Eji m ire akara na-azụ ezinaụlọ m kamgbe afọ 1998 - Chibueze Damian (Baba Akara)
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu na Okechukwu Omeire
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist na Video Journalist
Maazị Chibueze Damian na-eghe ma na-ere akara akọwaala etu o si malite ime nke a nakwa ihe ndị o jirila ire akara mepụta n'ezinaụlọ ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Damian kwuru na ihere anaghị eme ya na ọ bụ dimkpa nwoke na-arụ ọrụ ọtụtụ ụmụnwaanyị na-arụ "maka na ọ bụ ebe onye na-eri ka ọ na-awachi."
O kwuru na ọ mụtara ighe akara n'aka nwunye ya kamgbe 1998, mgbe nna ya ukwu ọ gbaara bọị gbahapụrụ ya na-edughi ya n'ọrụ.
O kwuru na ọ bụ etu ahụ ka ya na nwunye siri malite ire akara site oge ahụ ruo ugbua bụ afọ iri na use (25yrs).

Damian gara n'ihu kwuo na o jirila ire akara ahụ zụọ ụmụ ya abụọ n'ụlọakwụkwọ ruo ogogo mahadum, rụọ ụlọ n'obodo ha ma zụọ ụgbọala.
Damian bụ nwafọ Ebonyi steeti mana ihe e ji maara ya na Mushin, Legọs bụ ebe ọ na-ere akara bụ 'Baba akara' maka mbọ ọ na-agba n'ighe nakwa ire akara ahụ.
O kwuru na ha na-amalite ahịa n'elekere atọ nke ụzọ ụtụtụ ma mechie ahịa n'elekere isii nke mgbede.
Kirie ihe o kwuru n'uju.



