Ogbambo: Etu ọrụugbo m si mụbaa ruo ugbo 22 na-akọpụtazị osikapa, ji na ihe ndị ọzọ - David Ezeonyekwere

Aha onyonyo, Ogbambo:Etu ọrụugbo m si mụbaa ruo ụlọọrụ 22 na-akọpụtazị nri- David Ezeonyekwere
Ogbambo: Etu ọrụugbo m si mụbaa ruo ugbo 22 na-akọpụtazị osikapa, ji na ihe ndị ọzọ - David Ezeonyekwere
David Ezeonyekwere
    • Onye dere ya, Okechukwu Omeire
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Otu nwaamadị dị afọ 22 akọwaala etu o siri chusoo akaraka ya n’ụzọ pụrụiche nke na-emepere ya ụzọ ịga akụkụ ụwa dị iche iche ugbua. David

Ezeonyekwere kọwara na ọ mụtara ọrụ ugbo site n’akụkụ ebe a mụrụ ya nke bụ n’otu obodo dị na Kaduna steeti.

Nwaamadị Ezeonyekwere kwuru na o bu ụzọ mụta ọrụ ire ahịa ngwa nri tupu ọ hụ na uru dị ọrụ ugbo. O kwuru na sizi n’ire ahịa nri malite ọrụ ugbo nke mụbara ruo ụlọọrụ 22 n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

Ngwa nri ọ na-akụpụta gụnyere osikapa, agwa, ji, ‘strawberry’, ‘water melon’, ‘broccoli’ na ihe ndị ọzọ.

Nwaamadị a kọwara na agbanyeghị na uru dị na ọrụ ugbo na Naịjirịa na e nwere ọtụtụ ihe aka mgba na-ebuso ndị ọrụ ugbo agha na Naịjirịa gụnyere – Enweghi ezi nchekwa, nsogbu na ọgbaghara na-adapụta n’etiti ndị ọrụugbo na ndị ọchị ehi, nsogbu idemmiri nakwa mgbanwe ihu eliegwu n’ụwa.

O kwukwara na ụfọdụ ihe efu gọọmentị Naịjirịa na-enyebu ndị ọrụ ugbo na Naịjirịa iji nyere ha aka abụrụla ihe a na-eresị ha eresị. Ezeonyekwere kọwara na dịka ọ gbara isi akwara n’ọrụ a na ugbua, o nweelaa ike ịkọpụta ọtụtụ ngwa nri ma na-ebuga ya na steeti Naịjirịa 31.

O kwukwara na ọrụ ugbo emepere ya ụzọ ịga mba Niger, Kenya, Togo, Rwanda, Ethiopia na mba ndị ọzọ dịka ebe ndị ọ garala mee ọzụzụ ịmụtakwu ihe ndị dị mkpa n’ọrụ ugbo.

O kwuru na otu n’ime ihe mere o jiri malitere ọrụ a bụ na o lere anya hụ na gọọmentị Naịjirịa enweghi ihe nkwado ọbụla ya dịka onye ntorobịa nke mere o jiri kpebie ichuso akaraka ya.

Ọ dụkwara ndị ntorobịa dị ka ya ọdụ sị na enweghi ọnụego bụ iwu mmadụ inwe tupu ọ malitere ọrụ ugbo.

Ọ kọwara na ọ ka mma mmadụ iji ego ole ọbụla o nwere malite ọrụ ugbo, zụta ala maọbụ gbazite ya ma na-arụ ya bụ ọrụ ruo oge ọ mụbara. Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ a ka ị gere ihe o kwuru n’uju.