Ọgbambọ: Ihe m gabigara n'aka onye chọrọ idina m n'ike mere m jiri banye n'ọrụ 'pop' n'ụlọ

Aha onyonyo, Ọgbambọ: Ihe m gabigara n'aka onye chọrọ idina m n'ike mere jiri banye n'ọrụ 'pop' n'ụlọ

Nwada Stella Chinonyerem Agu kọwaara ihe mere o jiri banye n'ọrụ ịma 'pop' na-agbanyeghi mahadum ọ gara.

Ọ sị na nke a malitere mgbe ọ gụchara akwụkwọ na-achọ ọrụ, na otu nwoke chọrọ idina ya tupu o nye ya ọrụ.

Agu sị na ọ gbara isi akwara sị kama ọ ga-eme ya, na ọ ka mma na ọ chọọrọ aka ọrụ.

Ọ sị na ọ gara mụọ etu e si arụ 'pop' n'ụlọ bụ nke o ji enyere ndụ ya aka ugbua.

Agụ bụ nwafọ Itukpa dị n'okpuruọchịchị Obingwa dị n'Abia Steeti.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Politeknik dị na Nekede, Owere.

Kirie ihe o kwuru n'uju;

Ọ bụ Vining Ogu na Chigozie Ohaka mere akụkọ a