Ọgba mbọ: 'Akwụsịrị m ezigbo ọrụ m tinye isi kpam kpam n'isi nri n'ịntaneti'
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebe na ọrụ adịghị n'obodo mana ndị ụfọdụ na-ahapụ ọrụ nke ha etinye anya n'ihe ka enye ha obi aṅụrị ma na-etinyekwa ego n'akpa ha.
Winifred Nwaanya bụ nwata Igbo si Anambara steeti gwara BBC Igbo etu o siri malite aka ọrụ ya n'ịntanetị nke bụ Zeelicious Food.
Nwada Nwaanya gwara BBC Igbo na ọ bụ oge ya na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbidi ka ya malitere aka ọrụ ya n'akụkụ.
Mana o ruru oge o ruru, ya hapụzie ọrụ ya kpam kpam maka ya.
Chọpụta etu o siri gaa.
Ndị mere ihe nkiri a: Chimezie Uche Agbo na Nnamdi Agbanelo