Igbo culture: O nwere ihe dị iche n'etiti omenaala na Ịgọ mmụọ?

- Onye dere ya, Chimezie UcheAgbo
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Tupu anyị agbapụ ya ọsọ, ka anyị buru ụzọ kọwaa ihe omenaala pụtara. Dịka ndị ọkachamara siri kọwaa, omenaala bụ ụzọ mba si eme ihe.
Etu ha si eri nri, eyi akwa, agba egwu, alụ nwaanyị, eti mmanwụ na ihe ndị dị icheiche ma gụnyere etu ha si ekpere chi ha nakwa efe ofufe.
Omenaala bara ụba nke ukwu ma bụrụ mgbọrọgwụ mba ọbụla ji aba.
Ọ bụkwa njirimara na-ekewapụta ha n'ebe mba ọzọ niile dị n'ụwa dị.
Ịmaatụ: E jirila uwe ishi agụ we mara ndị Igbo nke pụtara na mba ọzọ ọbụla na Naịjirịa na-ahụ onye yi akwa ishiagụ dịka onye Igbo maọbụ onye chọrọ ikwado ndị Igbo.
Isi a hụrụ kwaba okpu maka akụkọ a bụ ndị Igbo, ka anyị tinye anya n'omenaala Igbo.
Omenaala Igbo
Ọtụtụ omenaala Igbo na-enye obi aṅụrị. Anyị na-edepụta ụfọdụ n'ime ha ebe a:
1. Ịgọ ọfọ
Ọfọ na ogu bụ otu ihe ndị Igbo ji aga, ịgọ ọfọ bụ ikpe ekpere. Etu ahụ ka ndị Igbo si ekpere mmadụ ezi ekpere.

2. Egwu
Igbo niile na-anabata egwu ogene dịka nke ha. Onye Igbo ọbụla nụrụ ogene na ọja na-enwe ụdị mkpali na-abịa ya n'ahụ.
Igbo na-ejikwanụ egwu dị icheiche eme mmemme ma nke a na-agụ agụ ma nke a na-agba agba. Ụfọdụ egwu Igbo na-agba bụ Adamma, atịlọgwụ, egedege wdgz.
3. Mmemme
E nwere ọtụtụ mmemme ndị Igbo ji egosipụta omenaala ha, dịka iri ji ọhụụ, ịwa akwa, ito ọgbọ wdgz.

4. Ịlụ nwaanyị
Ndị Igbo nwere usoro ha ji alụ nwaanyị. Obodo dị icheiche nwere etu ha si eme nke ha mana otu ihe dị na ha niile bụ na a na-edebe ego e ji alụ nwaanyị.
O nwere ebe ndị na-eme ịgbanwkụ nakwa iru mgbede.
5. Ịwaọjị
Ndị Igbo bụ ndị na-anabata ndị ọbịa nke ọma, ọ bụ omenaala Igbo ịwara onye ọbịa niile ọjị iji nabata ya.

6. Ibi ugwu
Ndị Igbo na-ebikwa nwata nwoke ugwu na mkpụrụ ụbọchị asatọ ka a mụchara ya.
7. Ikuchi nwaanyị na ihachi nwaanyị
Nke a bụ ebe nwoke ga-akụchi nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ.
Omenaala Igbo karịrị akarị mana ugbua, ka anyị lebaa anya n'okpukperechi ndị Igbo.
8. Mmọnwụ
Dịka ndị mba nwere mmọnwụ ha ji akpa ụmụaka obi aṅụrị n'oge ekeresimesi, etu a ka mmanwụ si dị icheiche. Ọ bụghị mmọnwụ Igbo niile bụ nke e ji gọọ mụọ, o nwere ndị ụmụaka ji eme onwe ha obi ụtọ ma ndị e ji enwe aṅụrị. Nke bụ eziokwu bụ na ụfọdụ ụlọụka Katọlik na-eti mmọnwụ ha ji eme ndị ụka ha obi aṅụrị.
E jikwa mmọnwụ eme mmemme. A na-akpọta ya ebe a na-eme emume dị icheiche ka ha gbaa egwu maọbụ mee ndị bịara emume obi ụtọ.

9. Nri
E ji nri dị icheiche mara ndị Igbo dịka ofe ọha, abacha, ụgba na ndị ọzọ
Okpukperechi n'ala Igbo
I leghachị anya ebe anyị malitere, anyị kwuru na etu mba si efe ofufe sokwa n'ime omenaala ha, nke a bụkwa eziokwu nye ndị Igbo.
N'ala Igbo, e nwere chi dị icheiche dịka ala, amadịọha, chukwu, ọnwa, anyanwụ, ikenga, agwụ, ekwensu dgz Obodo ọbụla nwere nke ha ma nwee ihe ha na-akpọ ya mana Chukwu Okike ka a maara dịka Chukwu kacha chi niile.
Chi ndị a nwere arụsị ndị e ji efe ha, ihe a na-akpọ arụsị ndị a dịkwa iche n'obodo ọbụla ị gara.
Ife chi ndị ahụ site n'arụsị e ji mara ha bụ okpukperechi ndị Igbo ma bụrụkwa naanị nke ha na-eme tupu ụka abịa.
Nke bụ eziokwu bụ na ezinaụlọ niile nwere chi nke ha nwee arụsị nke ha.
Usoro ikpere arụsị ndị ahụ dị icheiche bụ ihe Igbo mara dịka ịgọ mmụọ.
Kama na dịka ịgọ ọfọ bụ ikpe ekpere ọma, ịgọ mmụọ bụ ikpere arụsị na chi ha.
Ihe e ji agọ mmụọ dịka igbu ọkụkọ wụsa ọbara ya, ịgba aja na ụfọdụ ihe ndị ọzọ bụ ihe mere na ọtụtụ ndị Igbo anabataghizi ya gụnyere na ụka bịara.
Ịgọ mmụọ gosiri na okpukperechi bụ naanị otu n'ime omenaala Igbo nke bụ na ọ bụghị mmadụ niile na-emezi ya ugbua. Ọtụtụ ndị Igbo na-agazị ụka, ha anaghịzi agọ mmụọ.
Nke a ọ pụtaziri na ha agaghị esonye gbaa egwu ogene maọbụ bie nwa ha ugwu maọbụ gọọrọ nwa ha ọfọ?
Azịza ajụjụ a bụ mba! makana omenaala ndị a abụghị okpukpere ịgọ mmụọ.
Ọ pụtara na onye Igbo na-aga ụka nwereike ịwa ọjị maọbụ gọọ ọfọ maọbụ gbaa egwu maọbụ gwọọ abacha ma ọ bụghị onye ọgọ mmụọ kama okpukpere nke ya bụ nke onye Kraịst.

Ebe foto si, Getty Images
Omenaala Igbo na Ụka Kraịst
Onye Igbo ekwesighi iji maka na ọ na-aga ụka tufuo omenaala ya niile bụ ejirimara ya.
Onye na-aga ụka ekwesighi ịgọ mmụọ maka na ọ bụ okpukpere abụọ mana e wezuga ịgọ mmụọ, e nwere ọtụtụ omenaala ndị ọzọ e ji mara ndị Igbo dị mma ka e chekwa ya.
Otu ụkọchukwu ụka Katọlik bụ Chiadika Okoli kwuru na egwu ọdịnaala Igbo na-enyere ha aka ịgbasa ozioma Kraịst.
O kwuru na ha na-eji egwu ogene na ọja eto Chukwu ebe ha na-etikwa mmọnwụ ha ji eme ndị mmaọdụ obi aṅụrị.
Ụfọdụ ndị mmadụ ekwuola na ụfọdụ omenaala Igbo adịghị mma ma kwesi ka a kwụsị ya kama ụfọdụ dị mma kwesiri ka a nabata ya ma chekwa ya nke ọma.
Ya bụ na ụjọ ekwesighị ịtụ onye Igbo ọbụla isonye n'ụfọdụ omenaala Igbo ndị dị mma na-abụghị ịgọ mmuo.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









