World Malaria Day: Ihe ise ịba jiri dị iche na Taịfọd

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-arịa ọrịa taifọd na-eche na ha na-arịa ịba n'ihi mgbagwoju anya dị n'ọrịa abụọ ndị a.
Ịba nke Bekee kpọrọ 'malaria' bụ ọrịa a na-ebute ma akwụnta tanye mmadụ nje bu ọrịa n'ahụ, ebe taifọd bụ ọrịa a na-ebute site nje a kpọrọ, 'Salmonella Typhi' nke na-aṅụta na
mmiri adịghị ọcha maọbụ nri mebiri emebi.
Ịba na Taifod bụ ọrịa abụọ a na-arịakarị na mpaghara Afrịka.
Dịka WHO siri kwuo, ịba na-egbu ihe karịrị mmadụ 400,000 kwa afọ, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka.
n'aka nke ọzọ, ngụkọ nke WHO mere n'afọ 2019 na-ekwu na mmadu ruru agbata nde iri na otu na iri abụọ na-arịa taifọd kwa afọ.
Taifọd na-ebutekwa ọnwụ mmadụ ruru agbata puku,otu nari na iri abụọ na asatọ(128,000) na putu otu nari iri isii na otu(161,000).
BBC gbara ọkachamara ahụike bụ Dkta Ikechukwu Okoroafor nke ụlọọgwụ, Mount Sinai Hospital, Lagos, ajụjụọnụ banyere ihe dị iche n'etiti ọrịa ịba na taifọd.

Ebe foto si, Getty Images
Njirimara ịba na taifọd
Nke a bụ ihe Dkta Ikechukwu Okoroafor kwuru maka ọrịa ọjọọ abụọ a:
- Nje na-enye iba bụ 'plasmodium falciparum' mana nje na-enye taifọd a na-akpọ ya 'Salmonella paratyphi'
- Ọ bụ anwụnta na-atanye nje na-ebute ịba n'ahụ, ebe a na-enweta Taifọd site n'iri nri fọtara afọta, nrị akwọghị aka sie ma ọ bụ mmịrị adịghị ọcha
- Njirimara onye na-arịa iba bụ isi-ọwụwa na ahụọkụ. Onye na-arịa taifọd na-enwekwa isi-ọwụwa na ahụọkụ. Mana a na-ejị nnyocha ọbara a mara nke bụ nke
- E ji 'antimalarial' were na-agwọ nje Iba ma jiri antibiotics agwọ Taifọd.
- Ọ bụrụ na-agwọchaghị Iba, o nwere ike bute isimgbaka, ọbara igbatu, ebe Taifọd agwọghị agwọ nwere ike bute mkpọpu eririafọ.
Gee ihe ise iba jiri dị iche na Taịfọd n'ọnụ Dr Ikechukwu Okoroafor:












