NBS 2019 Poverty and Inequality Report: 'Anyị amaghị ebe NBS sịrị nwete mkpebi ha maka Ebonyi'

Igbo kwuru si na ekwe kwụọ ama agbaa.
Okwu a pụtara dịka ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ọgụgụ akpọrọ "National Bureau of Statistics" wepụtara etu ubiam si dị na steeti dị iche iche na Naijiria.
Mwepụta a gosiri na Ebonyi steeti kacha bụrụ steeti nwere ndị ogbenye na mpaghara ọwụwa anyanwụ.
Dịka ha nwere pacenti iri asaa na itolu na ụma bụ ndị ogbenye.
Etu a ka ọ dịkwa ha n'afọ abụọ gara aga. Guọ maka nke ahụ ebe a: Ebonyi so kachasị daa ụbịam na Naịjirịa.
Anyị a na-ajụ "ọ bụ na agụba adịghị nkọ ka ọ bụ na ọkpụisi amaghị akpụ?"

Ebe foto si, NBS
Ihe Gọọmenti Ebonyi steeti kwuru
BBC kpọtụrụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji maka ihe gọọmenti Ebonyi nwere ikwu maka nyocha a.
Orji kwuru na ọcheghị na nyocha ndị ngalaba NBS mere zuru oke.
O kwuru na enwere ọtụtụ ụzọ esi atule mmepe na ọdịnma ndị obodo.
Orji kwuru sị " Ọ bụrụ ahụike,ihe obodo ji ebi, agụm akwụkwọ, nchekwa obodo na ịkwalite ndị obodo bụ ụzọ ha siri mee ntule ha, ha mara na nke ahụ bụghị eziokwu"
O kwuru na Mgbe ngalaba ahụike WHO nyochara maka ụmụaka amụru ọhụru ị di ndụ, ha chọpụtara na nke Ebonyi steeti so na nke kacha mma.
Orji kwukwara na ọ bụ mpaghara ọchịchị nke dị na Ebonyi steeti kacha bụrụ mpaghara nwere ndị bara mahadụm n'afọ 2017.
O kwuru na ọbụghị ị ga ime obodo jụọ ndị mmadụ ego ole ha na-erete n'ahịa ma ọ bụ ụdịri ụlo ha bị, O kọwara na nke a abụghị ụzọ ziri ezi n'ihi na ndị Ebonyi steeti abụghị ndị anya ukwu.
Ọ rụtụrụ aka na ụlọọrụ ngalaba NBS nke dị na Ebonyi na anọkarị na mgbachi, ma keduzie etu ha ga-esi rụọ ọrụ ha nkeọma.
Ajụjụ kacha mkpa ugbua bụ kedụ etu ndị bi na steeti niile nọ n'ọwụwa anyanwụ ga-esi gbanahụ ụbiam?
Kedụ etu ndị steeti ọwụwa anyanwụ ga-esi gbanahụ ubiam?
Ọkammụta n'ihe gbasara akụnụba obodo bụ Kachi Ononude tupenyere BBC azụ etu steeti nọ n'ọwụwa anyanwụ ga-esi gbanahụ ubiam okachasi n'Ebonyi steeti.
Lee ihe okwuru.
1. Gọọmenti steeti ikwalite ndị steeti ha.
Maazị Ononude kọwara na ọ dị mkpa ka gọọmenti steeti niile tinye uchu na ikwalite ndị steeti ha.
O ji Ebonyi steeti were kọwaa na Gọvanọ Dave Umahi agbaligo ịrụpụta ihe dị iche iche eji enyere obodo aka dịka okporo ụzọ na ihe ndị ọzọ.
Kama i lee anya, ọtụtụ ndị ntorobịa na-ere ihe n'okporo ụzọ steeti dị iche iche na abụkari ndị si Ebonyi steeti.
Nke a gosiri na enweghị ọrụ maọbụ ihe ha ga-eji kwado onwe ha na steeti ha.
Ononude kwuru "Ebonyi bụ steeti Chukwu ji ihe ọnatarachi dị iche iche gọzie kama ọ naghị abara ndị steeti ahụ uru. Gọọmenti Ebonyi kwesịrị ihibe ụlọ ọrụ na arụpụta ihe ga-eme ka akụ ọnatarachi ndị a baara ndị Ebonyi uru."
Akụ ọnatarachi ndị a gụnyere nnu, osikapa, ọra igwe na ihe ndị ọzọ bụ ihe gọọmenti kwesiri iji kwalie ọnọdụ akụnụba ndị Ebonyi steeti.

2: Ụmụafọ steeti ihiwe ụlọ ọrụ na Steeti ha.
Mazi Ononude kwuru na ọ dị oke mkpa ka ndị Ebonyi steeti nọ mba na obodo dị iche iche weghachi akụ ha n'obodo ha.
Ọ kwuru si; "I lee anya ị ga-ahụ etu ndị Imo steeti si mee ka Owere bụrụ ebe kacha nwee ụlọ oriri, ndị Ebonyi steeti nwekwara ike ime ka ejiri otu ụlọ ọrụ mara ha."
Nke a na-akọwa ka ndị Ebonyi steeti nwere ego were ego ha rụpụta ụlọ ọrụ dị iche iche iji nyere ndị steeti ha aka.












