International Day of the Girl Child: Onye sị na ụmụnwaanyị Igbo anaghị agụ akwụkwọ?

Okonjo Iweala

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Kepukepu na-ekwu na ụmụnwaanyị Igbo anaghị agụ akwụkwọ ọ bụ ezie ka ọ bụ okpotokpo asị?

Igbo sị na anaghị ekpuchi afọ ime aka nke mere ka anyị mee nyocha i ji mara nke bụ eziokwu na nke bụ akụkọ ndị omekome n'ihe gbasara ụmụnwaanyị na agụm akwụkwọ.

Kama tupu anyị azọpụ njem a, ụmụnwaanyị Igbo dịka Chimamanda Adichie, Ngozi Okonjo-Iweala, Oby Ezekwesili, Flora Nwampa, Buche Emecheta,Onyeka Onwenu, Dora Akunyili, Joy Uche Ogwu,dgz. Anyị bido taa anyị agaghị ede cha.

Ụmụnwaanyị Igbo ji eme ọnụ

Ebe foto si, Arunma Oteh, Chimamanda Adichie, Oby Ezekwesili

Nkọwa foto, Ala Igbo nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị meterela ihe e ji echeta ha ma na Naịjirịa ma n'ụwa gbaa gburugburu

Lee ụfọdụ ụmụnwaanyị Igbo bụ ijele n'ihe ha na-eme

Chimamanda Adichie

Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Adichie bụ onye odeeakwụkwọ a ma ama na mba ụwa niile

Adichie so n'otu ada ndị Anambara ji aba mba ma na Naịjirịa ma na mba ụwa gbaa gburugburu.

Ọ bụ site n'ihe o detere n'akwụkwọ dịka ode akwụkwọ pụrụiche? Ka ọ bụ site n'okwu o kwutere site na nkwenye o nwere na nwoke na nwaanyị ha nhatanha nke a kpọrọ "feminism" na Bekee?

A ga-ekwu ole ghara ole ebe ọ gbasara nwaada a? Ọ bụ otu onye ọ na-abụ o kwuo okwu ebe niile enwuru ọkụ.

O nwetala ọtụtụ nturuugo nakwa ihe nrite karịrị iri.

A mụrụ ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Septemba 1977.

Dora Akunyili

Dora Akunyili

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O nwetara nturuugo ruru narị itoolu n'ọrụ ọ rụrụ

Otu nwaanyị a na-asị "unu abịala"; nwaanyị a mere ihe e ji echeta ya ma n'ọnwụ.

Akunyili zọrọ ọtụtụ ndị mmadụ ndụ site n'ibuso ndị na-arụpụta ọgwụ adịgboroja agha, oge ọ rụrụ dịka onyeisi ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ a kpọrọ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC).

Ọ rụrụ dịka minista na-ahụ maka mgbasa ozi site n'afọ 2008 ruo 2010, tupu ọ zọọ ọkwa onye omeiwu ukwu ga-anọchite anya ndị Anambra Sentralụ; mana Chris Ngige ekweghi ya zọta oche ahụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Julaị 1954, ọ nwụọ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Juun 2014.

Ngozi Okonjo-Iweala

Ngozi Okonjo-Iweala

Ebe foto si, Getty Images

N'agbanyeghi na a mụrụ ya na Delta steeti, mana a ga-agụnye ya n'okpuru ụmụnwaanyị Abịa steeti makana ọ bụ ebe ahụ ka a na-alụ ya.

A ga-akọ ole ghara ole maka Okonjo-Iweala?

A bịa n'ihe gbasara nchekwa akụnaụba obodo, ọ nọ ya.

A bịa n'ihe gbasara mkpata na mmefu na mbaụwa, ọ kwụ chịm.

Ọ bụ onye ihe gbasara ego na nchịkọta akụnaụba doro anya ọfụma.

A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Juun, 1954.

Oby Ezekwesili

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, Oby Ezekwesili

Nkọwa foto, Ezekwesili bụ ezigbote agbara nwaanyị a ga-akpọ "a kwaa a kwụrụ" n'okwu gbasara Naịjirịa.

A ga-akọ ole ghara ole maka nwaanyị a pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala, na-ama gọọmentị aka n'ihu ma bụrụkwa onye na-ebu ịzọta ikike dịrị onye n'isi?

Ezekwesili arụọla dịka minista ugboro abụọ na Naịjirịa oge Olusegun Obasanjo chịrị, ma sorokwa n'ime ndị Naịjirịa rụtụrụla na ngalaba ụlọakụ mbaụwa a na-akpọ World Bank.

A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ 1963.

Uche Jombo

Uche Jombo

Ebe foto si, Uche Jombo/ Instagram

Nkọwa foto, Uche Jombo enwetala ọtụtụ ihe nrite maka ime ejije

Ọ bụrụ na ị na-ele ejije ndị Nollywood ma ị maghị onye nwaanyị a bụ, i lewela?

Jombo na-eme ejije dịka "actress" ma na-emepụtakwa ejije dịka "director".

A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba, 1979.

Virgy Etiaba

Virgy Etiaba

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Etiaba chịrị site n'ụbọchị abụọ nke Nọvemba 2006 ruo Juun 13 nke 2007.

Ị ma na ọ bụ Etiaba bụ nwaanyị mbụ chịrị steeti ọbụla na Naịjirịa?

Virginia Etiaba bụbu osote gọvanọ Anambara steeti, rigoro ọchịchị ka ndị ụlọomeiwu steeti ahụ chụturu Peter Obi bụ gọvanọ oge ahụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 1942, dịka wikipedia si kwuo.

Onyeka Onwenu

Onyeka Onwenu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeka Onwenu bụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị rụrụ ọrụ n'okpuru Ikedi Ohakim

Onwenu bụ "olu ogene" nakwa agbara nwaanyị ma a bịa n'ihe gbasara ịgụ egwu.

Dimkpa nwaanyị a bụ otiegwu, ọ rụburu dịka onye ntaakụkọ na BBC/NTA, ọ na-emekwa ejije na Nollywood kwa mgbe.

O nwetala nturuugo dị icheiche maka ime ejije nakwa egwu ya.

Genevieve Nnaji

Genevieve Nnaji

Ebe foto si, Instagram/Genevieve Nnaji

Nkọwa foto, Genevieve Nnaji nwere nturuugo "Member of the Order of the Federal Republic" nke gọọmentị etiti nyere ya n'afọ 2011

A kọwa akụkọ maka ejije na Naịjirịa ma a kpọbeghị aha nwaanyị a Imo steeti ji eme ọnụ, aha e bidokwalanụ?

Nnaji emeela ejije karịrị narị, ma nweta ihe nrite nakwa nturuugo karịrị iri.

Ọ na-emepụtazị ejije nke ya ugbua, o mepụtara nke ndị ọnụ na-eru n'okwu na Hollywood zụụrụ.

A mụrụ ya n'ụbọchị atọ nke ọnwa Mee, 1979.

Linda Ikeji

Linda Ikeji

Ebe foto si, Instagram/Linda Ikeji

Ikeji bụ otu onye a na-akpụkarị n'ọnụ na Naịjiria ọkachasị ma a bịa n'ihe gbasara ide ihe n'ịntanetị nke Bekee kpọrọ "Blogging".

Ọ nwere ụlọmgbasaozi nke ya, ọ bụkwa onye ọmepụrụ onye n'ihe gbasara ilekọta ụmụagbọghọ.

O nwetala nturuugo ma na Naịjirịa ma na mba ofesi.

A mụrụ ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Septemba, 1980.

Chioma Ajunwa

Chioma Ajunwa

Ebe foto si, Instagram/Chioma_ajunwa

Nkọwa foto, Ajunwa bụkwa onye ọgba ọsọ mgbe ahụ, bụzị onye uweojii Naịjiria ugbua

Ihe Ajunwa mere n'egwuregwu Naịjirịa so n'ihe ndị mmadụ ga-akpụgide n'ọnụ n'ụwatụụwa.

O ji ụkwụ wụtara Naịjirịa ọlaedo mbụ ya n'Olimpiks n'afọ 1996.

O nwere nturuugo "Member of the Order of Niger - MON"

A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Disemba, 1970.

Flora Nwapa

Flora Nwapa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwapa tinyere uchu n'ịrụgharị ala Igbo mgbe a lụchara agha Biafra

E nwereike ịgụpụta ndị odeakwụkwọ si Naịjirịa ghara ịkpọ aha Nwapa? Ọ dị egwu!

Nwapa bụ 'a takata a gbọo' n'ide akwụkwọ, nke mere ka ụmmụnna ya chie ya Ogbuefi ma mee ka mbaụwa mara onye ọ bụ.

Ọ rụkwara dịka onye nkuzi, minista na-ahụ maka ahụike nakwa mmekọrịta mmadụ na mmadụ, ma mechaa rụọ ka minista na-ahụ maka ala na mmepụta obodo.

A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị, 1931, mana ọ nwụrụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba, 1993.

Osinachi 'Sinach' Joseph (Kalu)

Sinach

Ebe foto si, Instagram/therealsinach

Nkọwa foto, Sinach agaala ọtụtụ mba dị iche iche gaa gụọ egwu ya

Sinach dịka e si mara ya, bụ otiegwu pụrụiche.

Ihe gbasara Chineke na ụka Kraịst na-amasị ya nke ukwu, mere ka ọ na-eti naanị egwu ụka.

A ga-ekwu ole ghara ole? Ọ na-agụ agụ, ma na-edekwa ede.

O nwetala ọtụtụ ihe nrite maka egwu ya.

A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Maachị, 1973.

Grace Amah

Grace Amah

Ebe foto si, Instagram/Grace Amah

Ị bụrụ onye na-ele ihe nkiri ndị Nollywood mgbe gboo, ị ga-amarịrị onye Amah bụ.

Aha ya wuru ewu ọfụma oge ndị dị ka Sandra Achums, Regina Askia na Rita Nzelu "na-achị" Nollywood.

A mụrụ ya ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị.

A bia n'ihe gbasara ule, ụmụnwaanyị Igbo na-agbalị.

A sị ka agụpụta steeti iri kachasi nwee ụmụnwaanyị gbara ule WAEC site n'afọ 2016 ruo afọ 2018, ị ga-ahụta na ụmụnwaanyị Igbo zatara aha ha.

A sị kwa ka achọpụta ụmụnwaanyị ole gafere ule WAEC, ụmụnwaanyị sị mpaghara ọwụwa anyanwụ so na ndị kachasị.

Chimamanda Adichie

Ebe foto si, chimamanda_adichie/ Instagram

Lee ya site n'afọ 2016 ruo 2018 na pacenti.

Ọnụ ọgụgu a gosiri na ụmụnwaanyị ndị si na steeti ndị dị na ọwụwa anyanwụ na-agafe ule WAEC ma atụnyere ha na ndị nke steeti dị n'ọdịda anyanwụ.

Etu ọ dị na Bar Chart

Ọnụ ọgụgụ ụmụnwaanyị lere ule WAEC

Ebe foto si, BBCIgbo

Nkọwa foto, Ọnụ ọgụgụ ụmụnwaanyị lere ule WAEC

Ọ bụghị akụkọ ọhụru na anaghị edokwa ọnụ ọgụgu dị iche iche na Naijirịa nke ọma.

Kama ngalaba na-ahụ maka ọnụ ọgụgụ n'Anambra steeti (Anambra Bureau of Statistics) nke ọnyeisi ha bụ Emeka Paul Obiekezie nyere anyị ọnụ ọgụgụ ụmụnwaanyị na ụmụnwoke ndị nọ n'ụlọ akwụkwọ prịmarị na Sekọndịrị n'afọ 2017.

Lee ka o sị kwụrụ n'Amabra Steeti:

Ndị "Junior Secondary"

Ndị "Senior Secondary"

Ndị Primary

Nyocha a ga-egosi gị na ụmụnwaanyị igbo ejighị agụ m akwụkwọ egwu egwu.

Lee ka o sị kwụrụ na Delta Steeti:

Ụmụnwaanyị Delta ekweghị kwa ka ụgbọ agụm akwụkwụ hara ha.

Onyeisi ngalaba ọnụ ọgụgụ na Delta Steeti bụ Joe Oghogbi nyere anyị ọnụ ọgụgụ ụmụnwaanyị nọ n'ụlọakwụkwọ gọọmentị nke ha depụtara n'afọ 2018.

Ndị Prịmarị

Ndị Sekọndịrị

Ndị Mahadum

Ugbua, zara anyị ajụjụ a; Ụmụnwaanyị Igbo a na-aga akwụkwọ?

Akụkọ ga-amasị gị