Enyinnaya Abaribe: Ọ bụ Buhari nọ n'Aso villa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Onyeisi ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị kachasị pee mpe na sineti bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola o nweghi onye omeiwu ga-elebanye akwụkwọ iwu ahụ anya rue mgbe coronavirus ga-akwụsị.
Ọ kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere nke a na-akpọ "Kwuo Uche gị", mpkparịtaụka BBC na Sinetọ Abaribe nwere n'ụbọchị nke anọ n'ọnwa Mee.
Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru na mkparịtaụka ahụ
Lee ebe o kwuru ya ebe a:
Skip Facebook post
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
- Gbasara mfesa Covid-19 o gwara ndị mmadụ ha gba mbọ kpuchie ihu ha site n'iji akwa mkpuchi ihu.
- O kwuru na akwa mkpuchi ihu a dị mfe ịchọpụta n'ala Igbo n'ihi na e nwere ọtụtụ ndị na-akwa akwa.
- O dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ na-eme ntuziaka gọọmenti wepụtara maka igbochi mfesa ọrịa coronavirus makana ọnwụ covid na-ebute dị n'ụzọ
- Gbasara etu e si eke ngwa enyemaka o kwuru na ọ dịghị mma ịnye ụfọdụ ndị ma gbawa ndị ọzọ aka
- O kwuru na ndị ụlọomeiwu gwara gọọmentị etiti ha chere ka achọpụta aha ndị ogbenye ebe niile tupu amalite ịke ya ọzọ
- O kwuru na e bidola ike ihe na Senatorial Zone nke ya ma ọ ga na-aga n'ihu kwa izu ụka.
- Gbasara Biafra o kwuru na ugbua abụghị mgbe a ga-asa ajụjụ nke ahụ.
- Mgbe a jụrụ ya maka onye n'Aso villa maọbụ Buhari kwuru eeh na ọ bụ onyeisiala Buhari.
- Gbasara ọnọdụ ndị Igbo na ntụliaka 2023, o kwuru na ọ ga-aka nke 2020 mma makana ndị Igbo ga-azọ ma nweta oche ọchịchị gbara ọkpụrụkpụ.








