Coronavirus symptoms: Kedụ njirimara ya m ga na-ahụ kpoku NCDC?

Ebe foto si, Getty Images
Coronavirus na agbasa n'ike na ebube ebe o dulagoro mmadụ 128,886 mụọ ma jidekwa ihe karịrị nde mmadụ abụọ n'ụwa.
Kedụ njirimara coronavirus?
Covid-19 na-ejide n'ume maọbụ ngụgụ.
Ọ na-egosipụta site na ahụọkụ nakwa n'ise ụkwara esepuaka.
Ụkwara ntịrịrị anaghị akwapụta ihe ọbụla dịka imi.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ na-akpọ nkụ, dịka ụlọọrụ British National Health Services dere.
Ụkwara esepụaka bụ mmadụ ịkwa ụkwara mgbe niile karịa otu awa, ụdị ihe ahụ mee mmadu ụgbọrọ atọ n'otu ụbọchị.
Ụkwara a were ike ikanjọ karịa otu o si emebu onye ahụ.
Nke a nwere ike ibute ume ibi mmadu, mee ọ di onye ahu ka eji udọ kechie obi ya nke ga-ebutere ya obi mgbu.
Onye ahụ nwere ike ị nwe ahụọkụ maọbụru na ahụ ya na-ekpo ọkụ karịa 37.8C. Nke a nwere ike ịme ka ahụ kpowe ọkụ maọbụ oyi mawa onye ahụ maọbụkwa oyiọmụma.
Ụfọdụ ndị ya bụ ihe mere sị na ọ na-ebutekwa akpịrị ịkpọnkụ, isi ọwụwa maọbu afọ ọsịsa.

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe ụfọdụ onye ahu agaghịzị anụ isi maọbụ nụ ụtọ nrị.
Njirimara ndị a nwere ike ịgosipụtawa n'abalị ise mana ọ bụ akarịa na ndị ụfọdụ.
World Health Organisation (WHO) sị na o nwere ike izo abali iri na anọ (14) n'ahụ mmadụ tupu ọ pụta ihe.

Mmadụ ole ka ọ naghị egosipụta n'ahụ ha?
Nchọpụta ndị British Medical Journal gosiri na Covid-19 anaghị egosipụta na ahụ mmadu ruru pasent iri asaa na asatọ (78%) maọbụ ọnọdụ nke Bekee kpọrọ asymptomatic.
Nchọpụta a kwenyere na ihe ahụrụ na Ịtali bụ ebe ọrịa nyụrụ ndị mmadụ ịkpakwụ bụ nke gosiri na mmadụ dị na agbata pasenti iri ise rụọ iri asaa na ise (50% - 75%) egosidghị njirimara ya bụ ọrịa ma ọli dika ya bụ ọrịa di ire n'ahụ ha ma sikwa n'ahụ ndị ahụ banye n'ahụ ndị ọzọ.

Ebe foto si, NCDC/twitter
Nchọpụta ọzọ emekwara na Iceland gosikwara na ihe dịka mmadụ iri ise (50%) bụ ndị bu ya bụ ọrịa enweghị njirimara ya.
Agbanyeghị, nchọpụta WHO mere ndị ọrịa a dị mmadụ 56,000 gosikwara:
Mmadụ ruru pasenti iri asatọ (80%) ji ntakịrị isi ọwụwa, oyi na ụmeọkụ (pneumonia).egosi ya.
Pasenti iri na anọ (14%) ndị ọzọ na-enwe ezigbo nsogbu njirimara dịka ume ibi onye ahụ maọbụ ekudaghị ume nke ọma.
Pasenti isii ndị ọzọ bụ ndị ume ha dagoro mba maọbụ ime ahụ ha juziri ịrụ ọrụ, bụ nke na-ebute ọnwụ.

Gịnị ka m ga-eme ma m nwee njirimara ọrịa a?
Ọtụtụ ndi nje a bara ahụ na-agbake ngwangwa ma ha zuo ike maọbu ṅụọ ọgwụ dịka paracetamol maọbụ nke Bekee kpọkwara acetaminophen.
Ọbụrụ na ị nwewe ahụọkụ, ụkwara maọbu umeọkụ were ọsọ were ije kpọwa ndị ọkachamara, maka ọnwekwara ike ọ bụru ọrịa umeọkụ maọbụ ọrịa ọkpọnkụ ndị ọzọ bụ ihe ahụ.
WHO sị gị kpọtụru ndị ọrụahụike ka ha gwa gị ebe ị ga-aga maka na enwere ike ohere agaghị adị ebe nke ị chọro i ga maka ihe na-ada ebe niile ugbua.
Kedụ mgbe kwesiri ị ga ulọọgwụ a?
Ihe kacha mkpa n'ime ihe ịkwesiri iji ga ụlọọgwụ bụ maka ume obibi.
Ndị Dọkịnta ga-enyocha gị ngụgụ gị mara ka o si didebe njọ. Ọ bụrụ na ọ dị ezigbo njọ mara na enwere ike i sị onye ahụ bịa nagalaba gbatagbata Bekee kpọrọ intesive care unit (ICU) bụ ebe a na-elekọta ndị o ji na njọ.
Ekwesiri itinye onye Coronavirus ji ikuku (Oxygen) nke gụnyere akwa mkpuchi imi maọbụ tubu ọ ga-eji na-ekute ume site n'imi.
Maọbụ o sie ike, enwere ike iji ngwaọrụ akpọrọ 'Ventilato'r mee ka ikuku sị na ọnụ ma n'imi na-aba onye ahụ ngụgụ. Mgbe ụfọdụ, agbawa onye ahụ onu si ebe ahụ nyewa ya ikuku.

Ebe foto si, NCDC/twitter
Kedụ ndị ọrịa a na-akanjọ n'ahụ?
Ndị nka, ndị nweburu ọrịa "asmtha", ọrịa suga na ọrịa obi ka ọrịa nwere ike ịka njo n'ahụ.
Achọpụtakwara na ya bụ ọrịa na-aka egbu ụmụnwoke karịa ụmụ nwaanyị.
Ọ bụrụ na ya bụ ọrịa ejisighị onye ahụ ike, ọ nwere ike ịgbake n'abalị ole maọbụ ole.
Mana ọ bụrụ na o ruru nke onye ahụ ịga ICU, onwekwara ike irucha otu ọnwa tupu ọ nwete onwe ya.

Kedụ ka ọrịa si didebe njọ?
Nchọpụta edere na akwụkwọ ndị The Lancet Infectious Diseases na akọwa na naanị mmadụ pasenti 0.66 bụ ndị ọrịa a ji, ka onwere ike igbu.
Nke a erughị ka ndị ọrịa 'flu' na-egbu bụ ndị dị pasenti 0.1%.
Ihe nwere ike ikponye aja na garị ọnụọgụ a bụ na ọbụghị mmadụ niile ya bụ ọrịa metutere ka agụchara.

Kedụ ka m ga-esi chekwa onwe m?
Ụzọ ka mma bụ iji mmiri na-agba agba na ncha kwọsie aka gị ike mgbe niile.

Coronavirus na-agbasa site n'ọnụ mmịrị maọbụ imi onye bu ya, mgbe ọ mara uzere maọbụ kwaa ukwara.

Mmadụ nwere ike ikuru ya n'ume mgbe ọ nọ n'ikuku maọbu biri ya n'aka mgbe ọ nọ n'elu ihe ọbụla imeturu aka were si otu ahụ banye onye ahụ n'imi, ọnụ maọbụ n'anya.

Yaa bụ, iji tishu kwanye ụkwara maọbụ maa uzere, imetu aka ịkwọghị akwọ n'ihu nakwa ịnọpu anọpụ mgbe gị na onye bụ ya nọ di mkpa karịa.

Ndị bụ nje a nwere ike ife ya mmadụ mgbe ha ka na-egosi njirimara ya ebe ụfọdu nwere ike ịmalite ifesasị ya tupu ha adaa ọria.
Akwamkpuchi ihu abụghị ihe kacha mma iji gbochie ọrịa a, dịka ndị ọkachamara si ekwu.
Agbanyeghị, WHO ka na-elebe anya ịmata ka ndị mmadụ aga erita uru na ya maka na ọ nwere ike ịme ka asọmmiri maọbụ imi si onye bu ya n'ọnụ maọbụ imi ghara ịtụsa n'ebe ọzọ.

















