Covid-19 Ventilator: Kedụ ihe ọ pụtara na ihe mere eji achọ ya maka ọgwụgwọ coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
Kamgbe ọrịa covid 19 bidoro kpawa ike n'akụkụ ụwa niile, otu okwu a na-anụkarị n'ọnụ ndị isi mba dị iche iche bụ "Ventilator."
Ndị ọrịa coronavirus ji na njọ nwereike ịgbanahụ ọnwụ maọbụrụ na ejiri ventilator nye ha ọgwụgwọ.
Mana gịnị bụ ventilator nakwa ihe ọ na-arụ?
Ventilator bụ akụrụngwa na-enyere onye ngụgụ ya anaghị arụ ọrụ ọfụma aka i kute ume.
Nke a ga-enyere onye ahụ aka ị buso nje ahụ mebiri ngụgụ ya agha ma gbakee.
Ọ dị na ụdị na ụdị.

E nwere nke ji ikuku si n'ahụ mmadụ arụ ọrụ nke ga-esi na tubu akwụnyere n'imi maọbụ ọnụ mmadụ agafe.
Nke abụọ gụnyere naanị ikwụnye mask n'imi na ọnụ onye ahụ, onweghị tubu ga-adị ya.
"Ventilation" ọbụla kwesiri inwe onye ga-anọ n'akụkụ ileta onye akwụnyere ya.
Kedụ ihe mere ventilator ji dị mkpa?
Ụlọọrụ World Health Organization (WHO) na-eche na mmadụ ruru pasenti 80 nwereike isi n'ọrịa coronavirus gbakee ọ bụrụgodị na ha agaghị ụlọ ọgwụ.
Mana akụrụngwa ventilator na-azọ ndụ ndị ọnọdụ ha gụnyere ekughị ume ọfụma makana o ga-enye aka webata ikuku ga-eme ka ha ghara ikubi, nwụọ.
Ndị na-enweghị ọnọdụ nọketere ọnwụ nwereike iji ventilator gụnyere maskị ihu, nke imi maọbụ nke ọnụ nwereike ibuba ikuku na ngụgụ.
Dr Shondipon Laha nke 'Intensive Care Society,' na-ekwu na ọ dị mma ka ndị ma anya ventilator bụrụ ndị ga na-eji ya ilekọta ndị ọrịa a na-arịa.
Nke a bụ makana ọ bụrụ na e tinyeghị ya bụ akụrụngwa ọfụma, o nwereike imerụ onye etinyere ya ahụ nke ukwu.
Ka ọ dị ugbua mba dị iche iche na-agbalị ka ha zụta ventilator maka ndị mba ha ọrịa nwereike ibutu n'ike.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:












