Lee ebe ala, ụlọ ga-adịrị gị ọnụala na mpaghara ọwụwa anyanwụ

Ụlọ

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Oliver De Coque tiri egwu sị "Olisa nyere onye ọbụla aka ka ọ rụọ ụlọ nke ya."

Onye ọbụla zụtara ala ma rụtanwuo ụlọ nke aka ya mara na chi ya agbaarala ya ekeresimesi.

Ala na ụlọ so na ihe e ji ekwu na akụ na-esi obi ike.

Ma dịka mmepe na-abata na obodo dị icheiche n'ala Igbo, ịzụta ala adawala oke ọnụ.

BBC Igbo kpọtụụrụ ndị ma anya ala bụ nke bekee kpọrọ 'land agents', iji mara ihe ala na-ada n'ahịa.

Lee ebe dị icheiche aka nwere ike iru gi ịgbata ala

N'Anambra

Ụlọ elu

Ebe foto si, Julacs

Ọnịcha, Nnewi na Ọka bụ obodo kacha mepee emepe n'Anambra steeti.

Ịgbata ala n'ebe ndị a abụghị ihe ụmụaka, mana i nwere ike zụta ala n'obodo ndị gbara obodo ndịa gburgburu.

Na mpaghara 'Three-Three, Nkwerre Ezunaka, Nsugbe na Igbarịam, otu oke ala nwere ike ịbụ bido otu nde naịra ruo nde abụọ.

Oke ala bụ nke bekee na-akpọ 'plot'.

N'Ogbunike, ala kacha ọnụ ala ga-eru nde naịra abụọ maọbụ atọ.

N'Ọba, otu oke ala dị n'ime obodo karịrị otu nde naịra na ọkara. Mana ala dị ebe mepere emepe ga-eru bido nde naịra atọ.

Mpaghara Obosi (Awada na Ugwuagba), otu oke ala ga-akarị nde naịra ise, ma ọ bụrụ na ị hụ nke a na-ere ere.

Agụ Ọka bụkwa mpaghara na-emepe emepe ugbua. I jiri nde naịra atọ na ụma, ị nwere ike ịhụ otu oke ala zụta.

N'Enugwu

Ala

Ebe foto si, Propertyprong

Ebe na-emepe emepe na Enugwu ugbua bụ akụkụ ụfọdụ n'Emene nke dị n'obod Nike.

Ebe ahụ ka mmadụ nwere ike ịzụta otu oke ala bido na otu nde naịra na ọkara ruo nde naịra atọ.

Na Centinary City nke dị n'okporoụzọ si Enugwu gawa Pọtakọtụ, mmadụ ga-azụtali ala bido na nde naịra abụọ na ọkara ruo nde naịra anọ.

Mana ịchọọ ịga ebe ọkụ na-enwu n'elu dịka Independence Layout, jide nde naịra asato ruo nde naịra iri na abụọ n'aka.

N'Imo

Ntọala ụlọ

Ebe foto si, Abdulwastecx

Owere bụ obodo kacha mepee emepe n'Imo steeti, bụrụkwaebe mkpori ndụ na-ewu ewu.

Ebe ala ka dị ọnụ ala ugbu a n'Owere bụ na mpaghara Obinze, Mgbirichi, Ụmụagwọ dịrị gawa.

Ị ga-ahụkwa ala aka gị ga-eru na mpaghara Orji, Amakohia, Ogbaku, na Nekede.

N'ebe ndị a, otu nde naịra ruo nde naịra atọ ga-azụtanwụ ala ga-aba ụlọ.

Okigwe na Orlu bụ ebe ọzọ na-emepe emepe n'ihi ụlọakwụkwọ mahadum ụfọdụ dị ha nso.

N'Abia

Ala

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ịzụta ala bụ nnukwu ihe n'ala Igbo

E nwere mpaghara Osisioma Ngwa ebe mmadụ ga-azụta ala bido nde naịra abụọ na ọkara ruo nde naịra anọ.

Ebe ọzọ na-emepe emepe ugbua bụ mpaghara Ukwa. Ị ga-azụta ala nde naịra abụọ ebe ahụ.

Mmadụ ga-ahụkwa ala n'Obi Ngwa. Ebe ndị a dị nso n'Aba nke bụ obodo ka mepee emepe n'Abia steeti.

Umuahia bụ isi obodo Abia steeti dị nta karịa Aba.

Ebe dịka Afara, Ubakala, Olokoro, Amakama, bụ ebe mmadụ nwere ike ịzụta otu oke ala bido na nde naịra abụọ na ọkara ruo nde naịra anọ.

N'Ebonyi

Ụlọ

Ebe foto si, Getty Images

N'oge mbụ, a na-eche na Ebonyi emepeghi emepe.

Taa, Abakiliki so n'otu obodo ka mepe emepe n'ala Igbo.

Ịzụta ala n'etiti obodo Abakiliki abụghị ihe nta, mana na mpaghara Izzamgbo, mmadụ ga-ahụ ala bido na nde naịra abụọ gbagowe.

'New Layout', Azuiyiokwu, 'Mile fifty' sokwa n'ebe ndị mmadụ ga-ahụ ala ọ ga-azụ mana chetakwa na agbaghị aka enwude ọtaarụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe mere m ejighi akwado mgbachi ụlọ uka maka covid19 - Archbishop Chukwuma