Real Estate: I nwere ala? Lee ihe ọ ga-eri gị ịrụ ụlọ ma i nwee nde naịra ise

Ụlọ ala
Nkọwa foto, I nwere ike iji nde naira ise(N5m) rụta ụlọ ala dị mma
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Dịka otiegwu Igbo a ma ama bụ Oliver de Coque siri gụọ n'egwu, ekpere nwa afọ Igbo ọbụla bụ "ka ọ rụọ ụlọ nke ya."

Ịrụ ụlọ bụ egwu ndị ọ kara obi n'ihi na ọ dịka ịchị ụtaba n'aka na-agba egwu.

Mana ọ bụ ebe aka rụrụ nwaanyị ka ọ na-ekonye di ya n'ihi na i nwee ala ma jidekwa ihe dika nde naira ise (₦5million), ị ga-enwe ike ịrụta ụlọ ị ga-akpọ nke gị.

Na nkọwa ya, ọkachamara n'ihe ewumewu nke Bekee kpọrọ 'Architecture' bụ Obinna Ogbuokiri kọwara BBC Igbo na onye nwere ala ma jide nde naira ise nwere ike iji ya rụta ụlọala.

Ụlọahụ ga-enwe n'ime ya; ọnụụlọ atọ maọbụ anọ- ebe nnabata ọbịa, ebe erimnri, usekwu na ụlọmposi.

Ụlọala

Ego ahụ zukwara gị ịgba ya bụ ụlọ ngwuru (fence), ma gbapuo mmiri (borehole).

Lee ihe ndị ọ ga-eri gị dịka Obinna, onye nwe 'Cartouche Shelter Limited, Owerri' siri kọwaa:

Akpa simenti
Nkọwa foto, Ọ ga-erị gị akpa siment 400 ịrụta ụlọala nwere ọnụ ụlọ atọ maọbụ anọ

Ngwongwo na ngwongwo:

Akara ntụ-ntụ

1. Okporoigwe( (12mm by 12 mm) ₦2,200 x okporo 100 = ₦220,000

2. Akpa Simenti - 400 x ₦2500 = ₦1,000,000

3. Blọk @5000× ₦40 = ₦200,000

4. 'Tipper' aja ọcha - 12×₦15,000 = ₦180,000

5. 'Tipper aja ụpa (laterite) 20 trips× N7,000 = ₦140,000

6. Ịwa ntọala ụlọ n'ọnụ N500×50 partitions = ₦25,000

7. Ego ọrụ (Workmanship) n'ọnụ ₦40×5000 blọk = ₦200,000

8. Osisi e ji akụ elu ụlọ = ₦500,000

9. Gbamgbam( stoned-coated aluminium) =₦ 1, 200,000

10. Ọnụ ụzọ @ 7x 20,000 = =₦140,000

11. Mpio (Aluminium Window) - 10x N22,000 = ₦200,000

12. Ite aja (Plastering) = ₦100,000

13. Uhie na ite uhie = ₦250,000

14. Sink @ 3x N5000 = ₦15,000

15. Water Closet = ₦15,000

16. Akọrọngwa latrik na itinye ya = ₦200,000

17. Ịgbapu mmiri(borehole) = ₦120,000

18. Ido ngwuru (fencing): = ₦800,000

Akara ntụ-ntụ
Aja
Nkọwa foto, O ga-eri gị 'trip' aja ruru 50

Usoro ị ga-agbaso na ihe ọ ga-eri gị:

1. Mbido

Ihe mbụ onye na-arụ ụlọ ga-eme bụ ilezi anya mapụta ntụzi eserese ụlọ ahụ n'ala ebe a chọrọ ịrụ ya.

Ogbuokiri kwuru na ọ bụ n'oge a ka a ga-eji osisi a kpodoro n'ala mapụta ọnụ ụlọ dịka o si dị n'akwụkwọ iji doo anya(architectural design) ka a ghara inwe nghọtahie ọbụla.

2. Ịkpụ blọk

Blọk

I nwere ike ịkpụ blọk maọbụ zụrụ nke a kpụrụ akpụ.

Ọ ga-ewe ihe dịka blọk puku ise maọbụ puku asaa ịrụta ụlọ ala nwere ọnụ ụlọ atọ maọbụ anọ.

Ndị ọrụ ụlọ doro anya kwuru na mmadụ iji aka ya kpụọrọ onwe ya blọk na-aka mma karịa ịzụ nke a kpụrụ akpụ.

Mana ọ bụrụ na ọ dị gị ọsọ ọsọ, i nwere ike ịzụ blọk gị.

Ogbukiri dụrụ ọdụ ka ị zụrụ ya n'aka ndị nwere igwe na-akpụ blọk n'ihi na ''nke ha na-esi ike."

Ọ dọkwara ndị mmadụ ji aka ha akpụrụ onwe ha blọk aka na nti banyere ịkpụ blọk n'udummiri sị, "mmiri nwere ike izo mebie blọk a kpụrụ akpụ."

3. Ịwa ntọala ụlọ

Ebe ndị nwụrụ n'ọmị a nọbu na-egwu ntọala

Dịka Ogbuokiri siri rụtụ aka, a na-awa ntọala n'ibe n'ibe nke ndị ọrụ ụlọ kpọrọ "partitions."

Ịrụ ụlọala nwere ọnụ ụlọ atọ maọbụ anọ ga-eri ihe dịka 'partitions' iri ise nke ọ kọwara e ji ihe dịka narị naịra ise maọbụ isii egwu.

O nwere ike dakarịa ma ọ bụrụ ala siri ike maọbụ na ọ bụ ala okwute.

Ceilings
Nkọwa foto, Ceilings

E gwucha ihe ndị a aga agwa aja, okwute na simenti were wụọ ala ahụ e gwuru rute n'ogogo a kpọọ 'damp proof course' na bekee ma were akpa wakịrịwakịrị kpuchie ya.

Nke a bụ iji gbochie miri si n'ala idebata n'ahụ aja ụlọ ma a rụchaa ya.

Ndụmọdụ ọzọ Ogbuokiri na-eneye onye na-arụ ụlọ bụ ịgba mbọ hụ na ọ wulitere ala ụlọ ahụ ka ọ karịa ogogo okporoụzọ iji gbalahụ ide ịwabata n'ụlọ ahụ.

Aha onyonyo, Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium

4. Iwulite rue ogogo 'lintel'

Ọ bụ ogogo blọk itoolu maọbụ iri ka a ga-edo site n'ogogo 'Damp Proof Course' were rute ogogo 'lintel' bụ ebe itinye ọnụ ụzọ na windo.

Ọ bụ n'oge a ka a na-eji okporo igwe rụkọta blọk na-ejịkọta ụlọ ahụ ọnụ; ma ụzọ, windo na aja.

5. Ido elu ụlọ

Tiles, marble, Granite
Nkọwa foto, Iji 'tiles', 'marble' maọbụ 'granite' bụ ka akpa onye ha. OỌ kara onye ji naanị nde naira ise mma iji 'tiles' n'ihi na ndị ọzọ ka ndị ọnụ ahịa

I dochaa 'lintel', ọ ga-eri gị ogogo blọk atọ idorute elu ụlọ ala ebe o kwesiri, dịka Ogbukiri , onye bụkwa onye nkuzi ' 'Architecture' na 'Federal Polytechnic, Nekede', Owere.

" Ọ bụ ebe ka ị ga-arụ 'concrete facial' nke ndị mmadụ ji 'parapet" mara. Ọ na-ewu ugbua n'ihi na ha ji ya achọ ụlọ ahụ mma."

Na nkọwa ya, ịrụ nke a nwere ike pụkụ narị naira anọ(N400,000).

6. Ịkụ osisi,mgbamgbam na ịdọnye ọnụụzọ na windo

Ọnụụzọ igwe
Nkọwa foto, Ogbukiri: Ọnụụzọ igwe ndị Naijiria rụrụ na-aka mma karịa nke a tụbatara

Ihe na-eso idolite ụlọ bụ ịkụ osisi nakwa mgbamgbam nakwa itinye ọnụụzọ na windo.

Ogbukiri kọwara na 'aluminuim coated zinc bụ ụdị mgbamgba e jizi arụ ụlọ ugbua.

Ọ gbakwara ama na ọnụ ụzọ igwe nke a rụrụ na Naijrịa na-aka nke e si mba China tụbata esi ike.

Ihe na-eso ihe ndị a bụ ite aja, itinye akọrọngwa latrik, mposi,afere e ji akwọ aka na ụmụ kirikiri ihe ndị ọzọ nakwa ite uhie.

Aha onyonyo, Obi dị m ụtọ na m na-eme ihe nwoke na-eme- Nwaanyị na-ete ụlọ uhie

Ọdachi ise i kwesịrị izere ma ị na-arụ ụlọ

Aha nkeananụānụ, Ọdachi i kwesịrị izere ma ị na-arụ ụlọ gị- Ọkachamara

1. Inye ndị amaghị nke a na-akọ n'ọrụ iwu ụlọ( ndị adịgboroja) ọrụ

Enyela ndị adịgboroja ọrụ ụlọ gị .

Ọtụtụ ụlọ na-ada ugbua bụ maka na e nyere ya onye ihe edoghị anya ka ọ rụọ.

2. Mee ntule dị ala ị chọrọ iwu ụlọ na ya

Ụfọdụ ala agaghị ebuli ụlọala, ebe ụfọdụ aghaghị ebuli ụlọ elu.

Ọ bụ nnyocha ga-agwa gị nke bụ nke.

Imeụlọ

3.Nhazi ụlọ gị ọ dabanyekwara n'ihe iwu kwuru?

Ogbuokiri dụrụ ọdụ sị, "Ọ dị mkpa i wegara ngalaba na-ahụ maka ewumewu nke steeti ị na-arụ ụlọ akwụkwọ were nata nkwado."

"Emeghị otu a, ha nwere ike ịkụri ụlọ gị ma ị rụcha ya."

4. Ndị 'Omonile' nwere ike iji gị n'ọrụ

N' obodo ụfọdụ, ndị ntorobia nwere ike inye gị nsogbu ka ịkwụta ha ụgwọ tupu iwu ụlọ gị.

Nke a bụ omenala a na-anụbu na mpaghara Naijiria ndị ọzọ mana ugbua nama abatala Ọka, a na-ahụzị ụdị agwa ọjọọ n'ala Igbo.

Ya mere, ọ dị mkpa na-kwadoro akwado maka ụdị ihe a.

5. Gbalahụ iji akụrụngwa adịgboroja arụ ụlọ.

Iji mee nke a Ogbuokiri sịrị na ọka mma ịhapụ onye ọrụ doro anya ka ọ zụọ akọrọngwa e ji arụ ụlọ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ