Building collapse: Lee ka ụlọ arụwara kamgbe afọ 20 si daa n'Owerri

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ndị bi n'akụkụ Amaram ebe ụlọ dara n'Owerri agwaala BBC Igbo na onweghị onye nwụrụ n'ihe mberede a.
Ndị mmadụ chọpụtara na ya bụ ụlọ anọla afọ iri abụọ tupu ọ daa ụbọchị ahụ.
Lee ihe nkiri ọ nọ ebe ahụ wee sete
Mgbe BBC kpọrọ ndị Uweojii nị n'Imo steeti n'ekwenti n'ụtụtụ a, ha kwuru na ha ga-akpọghachị anyị ma gwa anyị ka o si mee.

Otu onye n'ime ndị sepụtara isi na ya bụ ihe mberede na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na o si na mpio mapụta mgbe ọ nụrụ ụda gosiri na ụlọ ahụ chọrọ ịdaa .
Ndị ọrụ gbata gbata eburula ndị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ.
Ruo ugbua, ndị uweojii ebubeghị ekwenti ha.





