Solomon Dalung: Ọ gbala isi ekwere ịkwụ $130,000 IAAF kwụfere AFN?

Solomon Dalung

Ebe foto si, @thenff ‏

Okwu Solomon Dalung kwuru gbasara ego otu IAAF kwufere Athletics Federation of Naịjirịa na-apịasa soshal midia ugbua.

Ndị ntaakụkọ Premium Times depụtara ọtụtụ bụ ihe ha kwuru na o kwuru mgbe ọ bịara ọgbakọ egwuregwu ịgba ọsọ emere n'Edo steeti.

Mana BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwenti, Dalung kwuru na ha ga-apụtarịrị n'okwu a maka mmekọrịta ha na ndị IAAF nwere.

Mgbe onye ntaakụkọ anyị gwara ya kọwa akụkọ na-efegharị na soshal midia, Dalung gwara ya ya ga-ajụọ ndị depụtara ya okwu ekwuru na o kwuru.

Anyị gakwara n'ihu jụọ ya maka etu ha ga-esi pụta n'okwu a dịka o si kwu, ọ pịṅụrụ ekwenti ya.

Akụkọ pukwutere anyị n'ụtụtụ a gbasara ndị isioche ndị na-eme egwuregwu maka ego akwụnyere AFN bụ nke furu ọhịa kemgbe 2017 abụghị ihe na-enye ọṅụ.

Minista na-ahụ maka egwuregwu na Naịjirịa bụ solomon Dalung agbachila BBC Igbo kọrọ BBC Igbo mgbe anyị kọrọ ya ka ọzara ọnụ ya.

Kayode Thomas bụ ọnụ na-ekwuru Minista ahụ n'ekwenti ịjụta ya maka ego IAAF na-ekwu na ha kwụfere NFA.

Thomas kwetere n'ezie "AFN ji IAAF ụgwọ ruru Puku dọla iri abụo".

N'ịta ha ahụhụ, IAAF bụ ngalaba na-achịkọta ndị na-eme egwuregwu na mbaụwa niile na-ekwu na ha ga-amachi AFN isonye n'egwuregwu ọbụla a na-eme maọbụrụ na ha akwụghachịghị ego akwụfere ha.

Gịnị na-ese?

Ndị ọgbaọsọ
Nkọwa foto, Ndị bịara asọmpi n'Asaba n'afọ 2018

Mana mgbe ha na-akwụnye ya bụ ego n'ọba ego, ha kwunyere ego ruru dọla puku otu narị na iri ise ($150,000) nke pụtara na o ji ?($130,000) karịa ego ha kwesiri ịnweta.

Gere ihe ndị ọzọ o kwuru ebe a.

Aha nkeananụānụ, IAAF vs AFN: 'Ka ego a si gaa mgbe m na-arụ na AFN'- Thomas

Onye nyụrụ ihe na-esinu?

Thomas kwuru na mgbe ihe a mere na Oga ya bụ Akawo Amaechi na-apụ n'oche dịka onyeisi AFN mana ọ gwara minista na-ahu maka egwuregwu na Naịjirịa bụ Solomon Dalung maka nkwụfe ego ahụ.

N'okwu ya, "mgbe onyeisi m gwachara Dalung maka ihe a, ọ sị ya weta ego ahụ. Amaechi wejere ya ego mana ọ maghị ihe oji ego ahụ wee mee."

Mbọ niile BBC Igbo gbara ịnweta minista Dalung kpụrụ afọ n'ala.

Ọnụ na-ekwuru ya bụ Nneka Anibeze gwara BBC Igbo na ya agaghị ekwụ ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu kama anyị kpọba minista na ọ bụ ya ma maka ego ahụ.

Anyị gbakwara mbọ ịnụta n'ọnụ onye na-achị AFN ugbua ma ndị chiburu mbụ mana ekwentị ha nyụrụ anyụ.

Gịnị ka nke a pụataara egwuregwu Naịjirịa?

Aha nkeananụānụ, 'Ihe a ga-ebutere Naịjirịa ezigbo ule n'ihu maọbụrụ IAAF mezuo obi ha' -Koiki

Tunde Kọiki bụ onye na-enyocha ihe na-eme n'egwueregwu kwuru na ọ bụrụ na IAAF mezuo nkwa ha ịmachị AFN, nsogbu ndị a ga-eme.

  • Naịjirịa agaghị eso n'egwuregwu Africa Games, World Athletics Champions day ga-eme na Doha nakwa egwuregwu ọbụla IAAF ga-ahazi.
  • Mmachi a ga-ete nnukwu ule n'ihu ndị Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: