FIFA: Infantino agbaala Dalung na ọgbakọ ya nkịtị

Solomon Dalung

Ebe foto si, @thenff ‏

Ngalaba na-ahazị egwuregwu bọọlụ n'ụwa niile a kpọrọ Federation of International Football (FIFA) gbara onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Solomon Dalung nkịtị oge ọ

kpọrọ ọgbakọ n'etiti ya na FIFA.

Dịka akụkọ si gaa, FIFA gbara nkịtị makana ha ka na-ewe iwe na gọọmentị wepụrụ Amaju Pinnick dịka onyeisi ngalaba na-ahazi egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa nke a kpọrọ Nigeria Football Federation (NFF) na Bekee.

Cheta na FIFA nyere Naịjirịa ruo ubọchị 20 n'ime ọnwa Ọgọst ịgbanwe mkpebi ha maka ịchụda Amaju Pinnick dịka onyeisi.

Dalung degaara onyeisi FIFA bụ Gianni Infantino akwụkwọ ozi na ya na mmadụ ruru 15 si ala Naịjirịa chọrọ ịhụ ya.

Mana FIFA deghachịrị Dalung akwụkwọ ozi na ya enweghị ike ịhụ ya.

Ha jụkwara ihe mere Chris Giwa so n'ime ndị chọrọ ịhụ Infantino makana o nwere mkpebi kwuru na o kwesịghị iso n'ọgbakọ ọbụla gbasara egwuregwu bọọlụ.

Ha dọkwara Naịjirịa aka na ntị nke ọma na ọ bụrụ na Naịjirịa akpọghachiteghị Pinnick dịka onyeisi NFF Naịjiria, na ha ga-amachi Naịjirịa.

Akụkọ ga-amasị gị