Onitsha building collapse: Igwe eji rụọ ụlọ dara n'Onitcha esighị ike - Engr. Aniekwena

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọ dara n'Onicha

Ụlọ dara n'Onitsha

Ebe foto si, Nnamdi Nwoye

I ga-echeta ebe ụlọ dagburu mmadụ anọ nwụrụ na Onisha, n'Anambra steeti

Onyeisi ndị otu Injinia na Onisha bụ Ikenna Aniekwena ekwuola na ọ bụ amaghị ọrụ na ejighị ngwa ọrụ zụrụ oke kwaturu ya bụ ụlọ.

O kwukwara n'igwe e ji ruo ya bụ ụlọ ezughị n'ọnụ ọgụ. Na kama iji igwe milimita asatọ na ihe e jiri rụọ ya bụ ụlọelu atọ bụ milimita anọ.

Ọ sịkwa na blọkụ e jiri rụọ ya bụ ụlọ esighi ike ma tinyekwa na ndị otu ha ekporola aja ebe ahụ iji mee nnyocha puruiche.

Ifeanyi sị na ka ọ dị ugbua, ma ndị gọmenti ewerela ya bụ ala ebe arụrụ ụlọ ahụ.

Buhari ekelela Kayode

Muhammadu Buhari ekelela Kayode Fayemi maka inweta oche onyeisioche ndí NGF

Ebe foto si, Kayode Fayemi/ Twitter

Nkọwa foto, Kayode Fayemi bụ Gọvanọ ndị Ekiti steeti

Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyeela Gọvernọ Kayode Fayemi ụkpa ekele dịka a họpụtara ya ka onyeisi oche ndị Gọvanọ niile na Naịjirịa.

Buhari mere nke a site n'akara Twitter ya ebe ọ nọ gwa ndị otu gọvanọ a ka ọ dịmma ndị mmadụ bụrụ ebum n'obi nke mbụ ha.

Narendra Modi emeriela na India ọzọ

Narendra Modi abụrụla Prime Minista India ọzọ.

Ebe foto si, Thinkstock

N'India, Narendra Modi emeriela ọzọ na ntuliaka mba ahụ.

Ndị otu pati ha ji oche narị atọ merie osote ya bụ ndị ji oche otu narị na ya bụ ntuliaka.

Akpụgala Nasser Al-Khelaifi ụlọikpe maka ebubo ngarị

Nasser Al-Khelaifi bú onyeisi ndí Paris Saint German

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nasser Al-Khelaifi bụ onyeisi ndí Paris Saint German

N'egwuruegwu, akpụpụla onyeisi Paris Saint-Germain bụ Nasser Al-Khelaifi maka ebubo ngarị asị na aka ya dị na ya.

Agbara Al-Khelaifi akwụkwọ maka ebubo na ọ chọrọ iji aghụghọ mee ka ebute World Athletics Championships Qatra.

Gee Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Onye enyemaka pụrụiche onyeisiala n'ihe gbsara obodo ndị ọzọ bụ Abike Dabiri

Ebe foto si, Abike Dabiri/Twitter

Onye enyemaka pụrụiche onyeisiala n'ihe gbsara obodo ndị ọzọ bụ Abike Dabiri ekwuola na ụfọdụ igwe nyocha ndị dị n'ọdọụgbọelu Naịjirịa anaghị arụ ọrụ ka ha kwesiri

O kwuru nke a dịka ọ na-azara ọnụ ya n'ihu kọmịtị ehibere ime nyocha na nwuchi anwụchiri Zainab Aliyu na mba Saudi Arabia.

Dabiri kwukwara na ndị ahụ anwụchiri na-ezoba ọgwụ ike na-akpa ndị mmadụ nwere ndị na-enye ha aka na Naịjirịa.

Ndị ọrụ kọstọm

Ebe foto si, Federal operations unit, Ikeja, south west

Ngalaba NAFDAC ekwuola na ha jichiri ngwa ahịa adigboroja nke ruru nde naira abụọ na ọma n'ọdọụgbọelu Enugwu.

Ha kwuru na ngwa ahịa ndị a bụ ndị esi China, Amerịka na Ireland tụbata Naịjirịa.

Na mba ofesi

Emmerson Mnangagwa

Ebe foto si, AFP/Getty

Nkọwa foto, Mnangagwa nwetere ihe karị pacenti 50 n'ime vootu atụrụ

Anwụchiela ndị ọrụ enyemaka ise eboro ebubo na ha na-achọ ịkwatu gọọmentị Zimbabwe

Gọọmentị mba ahụ kwuru na ha gara ọmụmụ nke otu si mba Serbia hibere ma nwụchie ha n'ọdọugbọelu Harare dịka ha na-alaghachite.

N'egwuregwu,

Samuel Chukwueze

Ebe foto si, Getty Images

Anya otu Liverpool na Manchester City dị n'ahụ Samuel Chukwueze NKE Naịjirịa dịka o kwuru na ọ ga-amasị ya ịgba bọọlụ na mba Ingland.

Cheta na Chukwueze na-agbara Villareal nke mba Spen bọọlụ ga-agbara Naịjirịa n'asọmpị iko mba Afrịka