Building collapse: Ụlọ adaala n'Abraka, Delta steeti

Ebe foto si, Nnamdi Nwoye
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta steeti bụ Onome Onovwakpoyeya ekwuola na ụlọ oriri na nkwarị adaala n'Abraka nke dị n'okpuruọchịchị Ethiope East na Delta steeti.
Onovwakpoyeya kwuru na ha amabeghị ma ya bụ ụlọ ọ dagburu mmadụ mana akwụkwọ akụkọ ndị ọzọ na-ekwu na ihe ruru mmadụ anọ nwụrụ, ebe a na-atụegwu na ụfọdụ tọro n'ime ya.
Akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwụ na ya bụ ụlọ akpọrọ 206 Hotel dị na Aghwana Avenue n'Abraka.
Ndị uweojii na-ekwu na ha amabeghị ihe kwaturu ụlọ ahụ mana ihe a ma bụ na mmiri na-ezọ ebeebe kemgbe mgbe Frịada.
Echekwara na mmadụ anọ bịara ọrụ n'isiụtụtụ Satọde tọrọ na ya bụ ụlọ bụ ndị nke eche na ha anwụọla ụgbụa.
Lee ihe nkiri ga-amasị gị
Akụkọ ga-amasị gi







