Ebonyi state building collapse: Enweghi onye ụlọoriri dagidere - Ndị uweojii

Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ha ka na-enyocha ihe butere ọdịda ụlọoriri Metro View n'abalị ụbọchị 17 nke Julaị 2019.
Akụkọ kwuru na mmadụ ruru iri isii ghọgburu ọnwụ dịka ha gbalahụrụ ọdachi ahụ.
Mana dịka Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ si kwuo, otu onye n'ime ndị na-achịkọta ụlọoriri ahụ gwara ha na ha hụrụ na ụlọ ahụ na-agbawa n'ime mkpụrụ ụbọchi ole na ole gara aga.
Nke ahụ mere ka ha malite ịrụgharị ụlọ ahụ tupu o mechaa si ebe e si arụgharị ya daa.
Odah kwukwara na enweghị otu mkpụrụ onye merụrụ ahụ maọbụ nwụọ n'ime ụlọ ahụ, makana mmadụ anọghị n'ime ya mgbe ọ dara.
Ndị kwesịrị ịnọ n'ime ya gara nzukọ n'ime otu mpaghara ụlọoriri ahụ, mere ka ha gbalahụ ya bụ ọdachi.

Ka a jụrụ ya maka ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ, o kwuru sị na ebe ahụ dara ada abụghị ebe ndị na-arụ n'ụlọoriri ahụ na-anọ.
Odah jikwa ohere ahụ kwuo na ha na-akpọku ndị nwere ebe ọha na-agbakọ, gụnyere ụlọụka, ụlọakụ, ebe obibi nakwa ebe ndị ọzọ, ka ha gbaa mbọ hụ na ha ledoro ụlọ ha anya ọfụma.
O kwuru na a gbapere ụlọoriri a n'ụbọchị 28 nke ọnwa Mee n'afọ 2005.
Gịnị ga-eme ma e mechaa nyocha?
Odah kwuru na ha mechaa nyocha, ha ga-esi n'ihe ha chọpụtara mara ihe a ga-eme ndị na-achịkọta ụlọoriri a.
Nke a bụ ma ọ bụrụ na a chọta ihe n'aka ha.
Lee ihe nkiri oge ụlọ dara n'Ọnicha










