Killings in Anambra steeti: Nwaokorobịa gburu enyị ya nwoke maka nwaanyị

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkọrọtọ ndị uweojii Naịjirịa

Ndị uweojii n'Anambra steeti anwụchiela otu nwaokorobịa na enyi ya nwoke bụ ndị gburu enyị ha ọzọ maka nwaanyị.

Dubem Okeke bụ onye gbara afọ iri abụọ na asatọ (28) ka a na-ekwu na ọ gbagbunyụrụ enyi ya nwoke bụ Chinedu Okoye anya maka nwaanyị.

E jidere Okeke (37) na enyi ya ọzọ bụ Ikechukwu Okafor bụ ndị asị na ha gara n'ụlọ Ifeanyichukwu Kamsisichukwu bụ enyi nwaanyị Okeke kpụpụta Okoye bụ onye rahụrụ n'ụlọ Ifeanyichukwu gba ya egbe.

Okeke na Okafor gara kpaa ya bụ arụ n'ụlọ Ifeanyichukwu n'elekere asaa n'ụtụtụ ụbọchị Tọzde dịka ọnụ n'ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed sị dee n'akwụkwọ o zigaara ndị ntaakụkọ.

Haruna dere na " ama agbaara ndị uweojii Ogidi Division mere e ji nwuchie ndị akpụobi a".

Chinedu Okoye gbara afọ iri abụọ na anọ (24) bụ onye Umuru n'Ogidi, Anambra steeti.

Ka a gbachara ya bụ egbe, e bugara Okoye ụlọọgwụ a kpọrọ 'Twinkle' dị n'Ogidi bụ ebe ndị dọkịta kwuru na ọ nwụọọla.

Haruna sị na nchọpụta amalitela n'ọnwụ ya bụ nwaokorobịa ebe ha ji egbe a sị na-eji gbagbuo ya bụ nwaamdị.

Ọ sị na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe mgbe ya bụ nchọpụta gachara.

Akụkọ ga-amasị gị