Ndị mmadụ kugburu onye uweojii gburu onye Lastma

LASTMA na Uweojii

Ebe foto si, @followlastma/@policeng

Nkọwa foto, Adeyemo Rotimi dị afọ iri anọ na isii tupu ọnwụ ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Njiji jiri dịka onye uweojii ngalaba FSARS zutere ọnwụ n'ike maka iji egbe gbagbuo onye ọrụ okporoụzọ bụ Lagos State Traffic Management Authority (Lastma).

Onye uweojii gburu onye ọrụ Lastma a kpọrọ Adeyemo Rotimi dị afọ iri anọ na isii n'ụbọchị Wednesde ebe elekere isii nke abalị, nke mere ndị mmadụ jiri kụgbuo ya n'ike.

Nke a mere n'ụzọ Iyana Ipaja dị na Legọs mgbe Rotimi na-akwụsị ụgbọala onye uweojii ahụ.

Ụlọọrụ LASMA dere maka ọnwụ onye otu ha nke a n'akara twitter ha:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'atufughi oge onye na-ahụ maka mkpesa n'aka ndị uweojii bụ Yomi Shogunle gakwara na twitter dee maka ọnwụ onye uweojii ahụ a kugburu na-akpọghị aha ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs Steeti bụ Chike Oti kwupụtara aha onye uweojii ahụ dịka Olukunle Olonade na-arụ na ngalaba FSARS nke Ikeja.

Oti kwuru "nke a mere n'ihi na onye uweojii nupuruisi n'iwu na-achị okporoụzọ nke mere onye LASMA jiri kwụsị ụgbọala bụ nke butere esemokwu n'etiti ha abụọ.

"Olonade wepụtara egbe ya ma gbagbuo Rotimi, nke a were ndị mmadụ iwe ha jiri kụwa ihe tupu ndị uweojii bịa napụta ya mana o mechara nwụọ n'ụzọ ụlọọgwụ.

"Onye Kọmishịọna ndị uweojii na Legọs Steeti enyela iwu ka e kpee Olakunle Olonade ikpe n'ọnwụ ma chụọ ya n'ọrụ ndị uweojii."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: