Keke ga-ebidozi gbawa ruo elekere itoolu n'Aba na Umuahia
Keke ga na agbaruzi elekere itoolu nke abali

Odeakwụkwọ mgbasa ozị gọọmenti Abia Steeti bụ Onyebuchi Ememanka ekwuola na gọọmenti Steeti ahụ agbatịala awa ndị keke na-arụ ọrụ na Steeti ahụ site elekere asaa ruo elekere itoolu nke abali.
Gọọmenti Abia steeti gbubiburu awa ndị Keke ji arụ ọrụ ruo elekere asaa ụbọchi niile maka mpu na ohi a na-ebo ndị ọrụ ahụ.
Mana ugbua, Ememanka kwuru na ndị otu keke akpọrọ Abia State Amalgamated Tricycle Owners Association kwetere na ha ga-etinye aka na-ikpochapụ ndị ajọọ mmadụ nọ n'ime ha igbochi iji ya bụ ụgbọ njem eme mpụ.
Ememanka sị na " ọ bụ nke a mere gọọmenti jiri nwee mmasị ịmegharị ya bụ iwu,"nke bụ na ugbua, keke ga na-akwụsịzị n'elekere itoolu nke abalị.
Ntọ atọrọla nne Siasia

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Ndị uweojii na Bayelsa ekwuola na ha na-achọ ndị tọrọla nne Samson Siasia bụbụ onye nchịkọta otu egwuregwu Naịjirịa n'isi ụtụtụ taa.
Ndị ntọ a si n'osimiri dị n'obodo Odoni dị na Sagbama bata nwụrụ Beauty Siasia dị afọ iri asatọ ma sikwa ebe ahụ gbalaga.
Atọrọla ya n'elekere abụọ nke isi ụtụtụ Mọnde na be ya dị na Bayelsa Steeti,
Onyeisi ndị uweojii na Bayelsa enyela ndị otu ha iwu ka ha banye ọhịa na ụzo niile ịchọta ndị kpara mkpamkpa ahụ, dịka ọnụ na-ekwuru ha bụ bụ Asinim Butswat sị kwuo.
Zuma sị na ya abụghị eze mpụ na Saụt Afrịka

Ebe foto si, AFP
Onyeisiala mba Saụt Afrika na mbụ bụ Jacob Zuma agọọla na ọ bụghị ya ji okpueze mpụ na mba ahụ.
Ọ gwara ndị Ọkaikpe e hibere maka ileba anya n'okwu ya na ebubo ahụ bụ mgbaokpuru agbara iji wepụ ya n'ọchichị.
Ọkụ gbara ahịa n'Enugwu

Ndị a wụrụ "acid" na Mgbuka
Ndị uweojii Anambara steeti kwuru na mmadụ isii n'ime asatọ a wụrụ "acid" na Mgbuka Obosi, anatala ọgwụgwọ ma laa be ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed, kwuru na mmadụ abụọ ndị ọzọ ka nọ n'ụlọọgwụ.
Obasanjo ataala ụkwa jaa eze

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo ataala ụkwa jaa eze n'akwụkwọ o zigaara Onyeisiala Muhammadu Buhari.
Ọ dọrọ aka na ntị na Naịjirịa na-akpọda ndagwurugwu nke ọnwụ, na ọ bụ naanị onyeisiala nwere ike ịdọpụta ya.
Wike emeriela n'ụlọikpe kacha elu

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe kachasị elụ na Naịjirịa ewezugala akwụkwọ Elvis Chinda gbara Gọvanọ Nyesom Wike maka asambodo ụbọchị amụrụ ya.
Elvis Chinda rịọrọ ụlọikpe ka ọ napụ Wike ọchịchị maka na asambodo ncheta ọmụmụ ya gbara mpe.
Iker Casillas sozi na ndị nchịkọta na Porto

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, ụmụibe Iker Casillas esila na ochee goolu ndị Porto banye n'ọkwa onye nchịkọta na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya n'otu egwu bọọlụ ahụ.
Casilla bụ onye si n'akwa ọrịa obi kulie ọnwa abụọ gara aga, sị na ya ga-anwa ike ya.










