Ihe m gabigara n'aka ndị ọchịehi - Mbaekwe

Chinedu Usman Mbaekwe kọwaara BBC Igbo ihe ọ gabigara oge a tọọrọ ya na 2017, ma kwuo na ụjọ anaghịzị ekwe ya gbaa n'okporoụzọ.
Akụkọ kwuru na atọrọla ihe ruru mmadụ iri asatọ na asaa na Kaduna n'ụbọchị ụka, nke a kpalitere ọtụtụ mmadụ ikọwapụta ihe ha gabigara n'aka ndị ntọ mmadụ maọbụ ndị ekperima n'okporụzọ na Naịjirịa.
Mbaekwe bụ otu n'ime ndị atọọrọ n'okporoụzọ, gwara BBC Igbo na obi ka na-amapụ ya ugbua ma enwee ka mmadụ si nyachie ya ihu ma ọ na-anya ụgbọala ya, maka etu ndị tọọrọ ya si nyachie ya.
O kwuru na mmadụ asatọ tọọrọ ya n'ụbọchị iri na atọ (13) nke ọnwa Maachị 2017, jide ha ụbọchị anọ tupu a hapụ ha ka a kwụchara ha nde naịra abụọ na puku narị ise (N2.5m).
Gee ntị ka ị nụ ihe o kwuru maka ihe ọ gabigara:
Mbaekwe kwukwara na ọ bụ ndị nọ n'ụlọ na-akacha ata ahụhụ ma atọrọ mmadụ maka na onye atọọrọ ma ụdịrị nsogbu ọ nọ n'ime ya mana ndị nọ n'ụlọ ga-eche ihe ọjọ niile nwere ike imego onye ahụ.
Lee ihe nkiri a ịhụ ihe ome ihe nkiri bụ John 'Mr Ibu' Okafor gabigara n'aka ndị na-atọ mmadụ.













