'Atọrọla mmadụ 80 n'ụzọ Birnin Gwari na Kaduna Steeti'

Akụkọ si Birnin Gwari nke dị na Kaduna Steeti na-akọwa na ndị obu egbe wakporo ndị na-agba n'okporoụzọ wee tọrọ mmadụ 80.
Ndị na-ahụ maka ndị na-arụ ọrụ ụgbọala bụ NURTW na-ekwu na ndị a bu egbe kwụsịrị ọtụtụ ụgbọala wee kpọrọ ndị nọ n'ime ha baa ime ọhịa.
Ndị bi ebe ihe a mere kwuru na ọ bụ ụbọchị ụka ka ihe a mere, ma kwukwa na ụgbọala ndị ihe a metụtara ka nọ ebe a hapụrụ ha.
Onwebeghị ihe ndị uweojii kwuru maka ihe mere.
Ozi si n'aka ndị NURTW na-akọwa na ndị ntọ a ebidola ịkpọ ndị nwe ndị a atọorọ, ịnata ha ego ha ga-eji gbapụta ha.
Ndị isi ndịagha Naịjirịa gara ebe ahụ ụnyaahụ maka mwakpo ndị obu egbe na-eme ebe ahụ.
Ntọrọ mmadụ na-eme na mpaghara Naịjirịa ihe a mere, mana ndị nke a metụtara karịrị ka ọ na-adị na mbụ.

Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:










