Onyeisiala Buhari kwuru na ọ bụ naanị nyocha ahụ ka ọ gara

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhari kwuru na ọ ga-eso n'ọsọ ntuliaka 2019
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari kwuru na ahụ siri ya ike, na ọ bụ naanị nyocha ahụ ka ọ gara ime na UK.

Ka ụgbọelu bu ya fedatara n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikwe n'Abụja n'elekere asaa nke abalị, ndị ọrụ ya na ụfọdụ ndị ntaakụkọ zutere ya.

Otu onye ntaakụkọ jụrụ ihe kpatara o ji bata otu ụbọchị tupu oge o kwuru na ọ ga-alọta (nke bụ ụbọchị satọdee).

Buhari zara ya sị "Ọ bụghị tupu oge a tụrụ anya. Naanị nyocha ahụ ka m gara mana ahụ siri m ike, daalụ."

Buhari gara njem n'ala Briten n'ụbọchị tuusde ebe ọ gara ịza oku dọkịta ya kpọrọ ya.

Ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Garba Shehu bụ onye dere ya na Twitter.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Cheta na Buhari nọrọ ihe ruru ọnwa anọ na Briten n'afọ 2017.

Njem nke a o mere n'izu a kpalitere ajụjụ ndị mmadụ chọrọ ịmata ma ahụ o siri ya ike isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị nke a ga-eme n'ọnwa Febụwarị 2019.

Presentational grey line

Akụkọ ga-amasị gị:

Presentational grey line