Obiagu Market Fire: Lee etu ọkụ siri gbapịa ahịa dị n'Obiagu n'Enugwu
Nnukwu ọkụ malitere n'ụbọchị Satọde gara wee tapịasia ngwa ahịa nakwa ụlọ ahịa ndị mmadụ n'Obiagu, Enugwu.
Onyeisi ndị na-atụ mgbere na ya bụ ahịa bụ Maazị Emeka Nnajiofor sị na ọ bụ n'amali elekere otu nke abalị ka ọkụ a malitere ire.
Ọ sị na ngwa ahịa ego ya dị nde kwa ndịi naira repịara na ihe mberede a.
Maazị Nnajiofor sị na ọ bụ mmadụ 68 ka ọkụ a metụtara ụlọ ahịa ha.
O kwukwara na amabeghi ihe kpatara ọkụ a.

Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi agaala ahịa ahụ ma tie ndị ọdachị a dakwasịrị aka n'obi.
Nnajiofor kwuru na gọọmenti Enugwu nyere mmadụ 68 a ọkụ ahụ gbara ahịa ha puku narị naira na otu na otu.
Ndubuisi Afor, Christopher Ogbodo, Ability Joshua, Chinwe Obasi na Maria Chukwu bụ ndị ọkụ gbara ahịa ha kwetara na ha nwetara puku narị naịra nke ha na-aka gọmenti ma yọzịa gọmentị ka ọrụgharịa ahịa ahụ ngwa ngwa dịka okwere ha na nkwa.
Emeka Nnajiofor kwuru na ihe ha chere butere ya bụ ọkụ ọgbụgba bụ na ọkụ Latrik enyere ya bụ ahịa karịrị nnukwu.





















