Hope Uzodinma: Ihe mere o jiri chụọ 'Accountant General' n'ọrụ

Ebe foto si, Facebook/Hope Uzodinma
Imo steeti enweela onye mgbakọ ego ọhụrụ aha ya bụ Obieze Chukwukama.
Chukwukama ga-anọchi anya Donald Igbo bụ onye gọvanọ Hope Uzodinma nyere ọsọ n'ụbọchị Tuzde.
Ọnụ na-ekwuru Uzodinma bụ Oguwike Nwachuwku zipuru akwụkwọ ozi n'ụbọchị Tuzde were kwuo na Chukwukama amalitela ọrụ na-egbughi oge.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Nwachukwu kwuru na ọ bụ ka ọrụ na-agawanye nke ọma ka gọvanọ ji họrọ onye mgbakọ ego ọhụrụ.
Ọ kọwara na "onweghi ihe ọbụla Donald Igbo mere, kama ọ bụ ka ọrụ gọọmentị na-aga n'ihu."
BBC Igbo kpọtụkwaara FCC Jones, bụ onye jibu ọkwa ọnụ na-ekwuru pati 'All Progressives Congress' nke Imo steeti.
Jones kwuru na "ọ bụ ikike dịịrị gọvanọ ịhọrọ onye dị ya mma ka ya na ya rụkọọ ọrụ."
Ọ gakwara n'ihu kọwaa na ọ bụ oge Rochas Okorocha bụ gọvanọ ka ọ họpụtara Donald Igbo dịka onye mgbakọ ego.
Oge Emeka Ihedioha malitere ọchịchị, ọ hapụkwara Donald ka o jide otu ọkwa ahụ.
Uzodinma hapụtụkwara ya n'ọkwa ahụ nwa obere oge tupu o mechaa nye ya ọsọ.
Ndịagha achịgharịala ndị isi na-ebuso Boko Haram agha

Ebe foto si, Facebook/HQ Nigerian Army
Ọchịagha Naịjiriaịa aha ya bụ Faruk Yahaya abụrụla onyeisi ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha bụ nke a kpọrọ 'Operation Lafiya Dole'.
Ihe ruru ndị ọchịagha mmadụ 13 ka a chịgharịrị n'ụbọchị Tuzde.
Ọnụ na'ekwuru ndịagha Naịjirịa kwuru na nchịgharị ahụ bụ iji mee ka ndị ọchịagha ahụ tinyekwuo uchu n'ọrụ ha.
Ndị ya bụ nchịgharị metụkwara gunyere Olusegun Adeniyi onye bụbu onyeisi 'Operation Lafiya Dole'.
Ugbua, Adeniyi agaala ụlọọrụ 'Nigerian Army Resource Centre' dịka onye nnyocha ukwu (senior research fellow).
Ndị ọzọ bụ A.C. Agundu, H.I Bature, U.M Mohammed, na ndị ọzọ.
Ha niile ga-amalite n'ọkwa ọhụrụ ha n'ụbọchị Wenezde, Abalị mbụ nke ọnwa Eprel afọ 2020.










