Imo State: 'O nweghi onye Gọvanọ Uzodinma nyere ọkwa 'Emir'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Akụkọ na'efegharị na soshal midia na-ekwu na Gọvanọ Hope Uzodịnma nke Imo steeti ahọpụtala onye ga-abụ 'Emir' na steeti ahụ bụ akụkọ ụgha.

Nnyocha BBC Igbo mere gosiri na onweghi onye ọbụla bụ 'Emir' na Imo steeti.

Ihe mere bụ na ndị Igbo na-ekpe okpukperechi Alakụba gara njem nleta na ekele n'ụlọ gọọmentị Imo n'ụbọchị Tuzde.

Ha gara ka ha gosi Gọvanọ Uzodinma onye ha họpụtara dịka onyeisi ekpere ha nke a kpọrọ Imam.

Dịka Ihe onyonyo BBC Igbo hụrụ si gosi, aha Imam a bụ Suleiman Njoku.

Ọ bụ onye Mbaise, ma bụrụkwa onye ọkaiwu.

Onyeisi otu a kpọrọ 'Imo State Muslim Council' bụ Basheer Uwakwe, sokwa mee njem a.

Uwakwe kọwara na ha họọrọ Njokụ dịka 'Imam' n'ihi ọnwụ Alhaji Dauda Onyeagaocha, bụ onye jibu ọkwa ahụ tupu ọ laa mmụọ.

Ọ bụghị Uzodinma ji aka ya họpụta 'Imam' ahụ dịka akụkọ ụfọdụ si ekwu.

BBC Igbo kpọtụkwaara Oguwike Nwachukwu bụ onyeisi mgbasa ozi Uzodinma, mana ekwentị ya agaghị aga.

Mana Marcel Nlemigbo, onyeisi pati APC n'Imo steeti kwuru na onweghị ihe ọbụla dịka ọkwa 'Emir' na steeti ahụ.

'Supreme Court' enyela APC ọsọ ọzọ

Duoye Diri
Nkọwa foto, Duoye Diri (yi akwa anụnụ anụnụ) bụ Gọvanọ Bayelsa steeti

Ụlọikpe kachasị enyela ndị otu pati 'All Progressives Congress' ọsọ gbasara ikpe onye meriri ọkwa gọvanọ Bayelsa steeti.

Na mkpebi e nyere n'Abụja n'ụbọchị Wenezde, ụlọikpe kwuru na ndị APC ejighi okwu.

Cheta na ndị ọkaikpe ise nke ụlọikpe kachasị kagburu mmeri David Lyon nke APC na ntuliaka gọvanọ Bayelsa e mere n'ọnwa Nọvemba afọ 2019, ma kwuo na ọbụ pati 'Peoples Democratic Party' meriri.

Ha kọwara na Biobarakuma Degi-Eremienyo bụ onye so Lyon zọọ ọchịchị dịka osote gọvanọ nyere ụlọọrụ INEC asambodo adigboroja.

N'ihi nke a, ha kagburu vootu niile nke APC (Lyon na Degi-Eremienyo) nwetara na ntuliaka ahụ.

David Lyon na Douye Diri

Ebe foto si, Lyon and Diri/ Twitter

Mana ndị APC gbara isi akwara ma gaghachi azụ n'ụlọikpe rịọ ha ka e lebaa anya n'ikpe ahụ ọzọ.

Ụlọikpe kachasị wee gbakwaa isi akwara kụchapụ ya bụ ikpe.

Ndị ọkaikpe ahụ dakwara ndị ọkaikpe ndị APC nakwa ọkaikpe David Lyon nha nde naịra iri n'otu n'otu maka ịmetọ usoro iwu.

Na nkwubi okwu ha, ndị ụlọikpe kachasị kwuru na ha abụghị nkịta na-agbụpụ racharakwa.

Ndị ụka Katọlik emeela ngagharị ekpere n'Enugwu

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Ndị ụka Katọlik n'Enugwu amalitela ngagharị ekpere iji ruo ụjụ maka ndị otu Kraịst e gburu egbu na Naịjirịa.

Cheta na ndị Bishọp Naịjirịa nyere ntuziaka ka ndị ụka ha niile yie uwe ojii n'ụbọchị Wenezde bụ ụbọchị ụka ntụ maka mmalite oge Lent.

Nke a bụ iji ruo ụjụ maka ndị niile ndi ekperima gburu n'ọdị nso a.

Amalitela akwamozu Hosni Mubarak

Ndị agha bu akpati ozu Mubarak

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ọ bụ ndị agha bu akpati ozu Mubarak.

Mba Egypt amalitela emume akwamozu maka aka chiburu mba ahụ bụ Hosni Mubarak.

Gọọmentị Egypt na-akwanyere Mubarak ugwu pụrụ iche na-agbanyeghi na ụlọikpe mara ya ikpe maka nrụrụaka oge ọ dị ndụ.

Onyeisiala mba ahụ bụ Abdul Fattah al-Sisi na ndị ọzọ welitere isi gara ya bụ emume, ebe ọbụkwa ndị agha bu akpati ozu Mubarak.

Gọọmentị wepụtakwara abalị atọ iji ruo ụjụ maka ọnwụ ya.

Mubarak nwụrụ n'ụbọchị Tuzde ka ọ gbachara afọ iri itoolu na otu.

A taala ndị Abia Warriors ahụhụ

Abia Warriors na Enyimba

Ebe foto si, Twitter/Abia Warriors

Ngalaba na-elekọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa eriela otu egwu bọọlụ Abịa Warriors iwu nde naịra ise maka iluso ndị Enyimba ọgụ oge ha abụọ sọkọtara mpi n'izuụka gara aga.

N'ime ego a, a ga-enye ndị Enyimba nde naịra abụọ na ụma ise.

Abia Warriors ga-agbakwa asọmpi atọ ha na-abịa abịa n'ama egwuregwu a kpọchiri akpọchi na-enweghi ndị otu ha ga abịa ịja ha ike.

Oge ọgụ ahụ dapụtara n'etiti ndị nkwado otu egwu abụọ a, e merụrụ onyeisi ndị Enyimba bụ Felix Anyansi-Agwu ahụ nke mere ka e buru ya gaa ụlọọgwụ.

Coronavirus abaala mba Ọljirịa

Ndị uweojii kpuchiri imi na mba Ọstrịa

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị uweojii kpuchiri imi na mba Ọstrịa

Ọrịa coronavirus abatala na mba ndị nọ na Yurop gụnyere Ọstrịa, Kroeshia na Swizaland, nakwa n'Ọljiria dị n'Afrịka, dịka ndị si mba Itali lọta butere ya.

Ka ọ dị ugbua, Itali so na mba ndị ọrịa a kacha enye nsogbu dịka o gburula mmadụ iri na otu n'ime ihe karịrị narị atọ bu ya.

Iwu ọhụrụ nwereike ikpuchite ndị omeiwu

Ndị ụlọomeiwu nta ebufeela iwu nke ga-ekpuchite ndị omeiwu etiti nakwa nke steeti n'aka onye ọbụla chọrọ ịgba ha akwụkwọ n'ụlọikpe.

Femi Gbajabiamila

Ebe foto si, Facebook/Femi Gbajabiamila

Nke a bụ ugboro abụọ a ga-ebufe iwu a bụ nke Femi Gbajabiamila bụ onyeisi ụlọomeiwu ahụ sị na ya akwadoghi.

Ọ sị na naanị ihe ga-eme ka ọ kwado ya bụ ma ọ bụrụ na iwu a ga-ebido n'afọ 2023, bụ mgbe ha ga-aritu n'oche ọchịchị.

A gbasaala ngalaba ZIS

Mohammed Adamu

Ebe foto si, Nigeria Police

Mohammed Adamu bụ onyeisi ndị Uweojii Naịjiria agbasaala ngalaba Zonal Intervention Squad (ZIS) iri na abụọ, n'ihi ogbugbu Kazeem Tiamiyu bụ ọgbaa bọọlụ ndị ngalaba ahụ kwapụrụ n'ụgbọala na-aga aga.

Ndị ngalaba ahụ nọ na-arụbu n'okpuru osote onyeisi ndị uweojii n'obodo ndị bụ okeala na Legọs na Ogun steeti.

Ọgbaaghara ataala isi mmadụ 21 n'India

Ndị nọ n'ọgbaaghara

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, A gbaala ihe ruru ụlọalakụba abụọ ọkụ kemgbe ọgbaaghara a dapụtara

Ọnụọgụgụ ihe nwụrụla n'ime abalị atọ ọgbaghara dapụtara n'obodo Delhi dị n'India, eruola iri abụọ na otu.

Mara na ọgbaghara a mere e jizi na-awakpo ndị ụka alakụba, dapụtara n'ihi okwu gbasara iwu amaala.

N'egwuregwu,

Otu onye ga-anụ ụda ya taa mgbe Real Madrid na Man City ga-ezute na Santiago Bernabéu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebe Cristiano Ronaldo na ndị Juventus ibe ya ga-eburu ọgụ gakwuru ndị Lyon na Frans.

Ụbọchị ụka ntụ

Taa bụ ụbọchị Wenesde ka ndị ụka Kraist nọ na mpaghara dị iche iche n'ụwa ga-anara akara ntụ.

Mana ndị Bishop nọ n'okpuru Catholic Bishops' Conference of Nigeria (CBCN) ekwuola na ha ga-eme ekpere ngagharị n'ụbọchị ụka na-abịanụ iji gosi iwe ha gbasara enweghị ezigbo nchekwa na Naịjiria.

Aha onyonyo, Ash Wednesday: 'Onye ọbụla chọrọ gị okwu maka uwe ojii i yi, gwa anyị'- Bishop Martins

Ihe gbasara nchekwa Naịjirịa

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha, mana ndị Boko Haram Kpọrọ ekwo nkụ

Ndị ụlọomeiwu ukwu agwala ọchịagha ndịagha Naịjirịa ka ha mepegharịa isi ụlọorụ ha n'obodo Garkida dị n'Adamawa steeti nakwa nnukwu obodo ndị dị nso oke ọhịa Sambisa.

Nke a na-abịa dịka ndị omekome wakporo obodo Garkida n'abalị ise gara aga.

N'egwuregwu,

Ndị Chelsea ji nkata kporo goolu atọ asataghị otu dịka Bayern Munich bịara n'azụ ụlọ ha gbabaa ha afọ n'asọmpi Champions League.

Barcelona na onwe ha zọrọla isi onwe ha n'aka Napoli dịka ha sara otu goolu e nyere ha iji gbaa onye lawa onye lawa.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ash Wednesday: 'Onye ọbụla chọrọ gị okwu maka uwe ojii i yi, gwa anyị'- Bishop Martins