Bayelsa state: Anapụla David Lyon mmịmị n'ọnụ nye Douye Diri

David Lyon na Douye Diri

Ebe foto si, Lyon and Diri/ Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' kpọpụtala Douye Diri nke PDP dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Bayelsa Steeti.

Onyeisi ụlọọrụ a bụ Mahmood Yakubu kwupụtara nke a n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.

Yakubu kwukwara ka e nye Diri asambodo ya ngwangwa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọ bụrụ na mmadụ gwara David Lyon na oche gọvanọ Bayelsa steeti agaghị abụ nke ya n'ụbọchị Fraịde, ọ gaghị ekweta.

Ikpe gbasara ntuliaka gọvanọ e mere na Bayelsa mere ka ụfọdụ ndị mmadụ kwuo na 'Supreme Court' aghọọla ogbu onye ụbọchị ndụ na-atọ ya ụtọ.

David Lyon na-ekwu okwu

Ebe foto si, Twitter/David Lyon

Nkọwa foto, David Lyon akwadoola ịṅụ iyi ọrụ tupu 'Supreme Court' awụọ ya n'ala

Cheta na ndị tubere David Lyon - onye pati 'All Progressives Congress' - ugo dịka onye meriri ọkwa gọvanọ Bayelsa na Nọvemba 2019.

Ihe onyoonyo gosiri ebe Lyon na-akwado etu ọ ga-esi agagharị n'ụbọchị ọ ga-aṅụ iyi ọrụ n'ụbọchị Fraịde Febuwarị 14 2020.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọ gaala n'ogige ebe a ga-anọ duo ya n'iyi ọrụ ma kpagharịa etu ọ ga-esi mee ya taa.

Mana ndị ọkaikpe 'Supreme Court' nọrọ n'Abuja sepụ Lyon ọnụ n'ara n'ike.

Akwụkwọ e jiri kpokuo ndị ọbịa 'Invitation Card'

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Akwụkwọ e ji zie ndị mmadụ maka idu n'iyi ọrụ nke David Lyon, mana nke a anyụọla ka ọkụ ugbua.

Ụlọikpe kachasị chuturu Lyon n'ọkwa gọvanọ n'ihi na ha kwuru na osote ya bụ Biobarakuma Degi-Eremienyo ji asambodo adigboroja wee zọọ ya bụ ọkwa.

Ndị ọkaikpe kwuru na ebe ọ bụ na Eremienyo etozughị ịzọ ọkwa osote gọvanọ, Lyon onye kpọ ya zọọ ọkwa ahụ eriela mperi.

Mkpebi a yiri ilu ndị Igbo na-atụ sị: "Ejula gawa ọ dọkpụrụ ikoriko ya."

Etu okwe si gbaa na Bayelsa

Ebe foto si, Twitter/INEC

Nkọwa foto, Etu okwe si gbaa na Bayelsa

Chetakwa na Eremienyo bụ onye nnọchite anya Bayelsa East n'ụlọomeiwu ukwu.

Mkpebi a 'Supreme Court' nyere pụtakwara na e nwere ike ịchụpụ ya n'ịkwa sịnetọ.

Enyela Diri asambodo mmeri

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

INEC enyela Duoye Diri asambodo mmeri ya.

Ọ fọziri ka e duo ya n'iyi ọrụ na-egbughi oge ọbụla.

A na-ele anya na a ga-edu Diri n'iyi ọrụ taa.

Nke a bụ maka na e tere ụgba e tere ose, Seriake Dickson ga-arịturịrị n'ọkwa ọchịchị taa bụ Fraịde dịka iwu si kwuo.

Ihe ọzọ nwere ike ime bụ na

Seriake Dickson

Ebe foto si, Twitter/Seriake Dickson

Nkọwa foto, Seriake Dickson ga-aritu dịka gọvanọ Bayelsa steeti taa bụ Fraịde, mana onye ka ọ ga-enyefe ọchịchị?

Ndị n'ọchị ndị n'akwa

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ndị mmadụ na-ekwu na ọgbaaghara amalitela na mpaghara Tombia nke dị na Yenagoa, isi obodo Bayelsa.

Ihe onyonyo dị na soshal media gosiri ebe ndị mmadụ mụnyere ọkụ n'okporo ụzọ.

Ha bucha akwụkwọ n'aka iji gosi iwe ha maka nchutu a chuturu David Lyon.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: