Mbaka Prophecy: Ekpere m ekpere, buo ọnụ ọtụtụ ụbọchị ruo mgbe amụma Hope Uzodinma mezuru

Aha onyonyo, Okwu mbaka maka amụma o buru Hope Uzodinma

Ụkọchukwu na-elekọta 'Adọration Ministry' Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka ekwuola na ya nọ n'ụlọ ekpere ya na-erighi nri ọbụla ganye na Ụlọikpe Ukwu ekwuo na Hope Uzodimma emeriela dịka gọvanọ Imo Steeti.

Fada Mbaka onye guzobere ụka ịtụ mmamma maka mmezu amụma o buru ụbọchị 31 nke ọnwa Decemba 2019 kwuru na obi dị ya mma na Hope bụ onye ga-azọpụta ndị Imo steeti.

Ọ gwara ndị Imo ka ha nye Hope afọ abụọ nke ọ ga ejị dozigharịa obodo ahụ.

Mbaka dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha sepụ aka ka ha si akọ ya ọnụ na Soshal midia n'ihi na amụma ya na ebụ bụ ọ natara chi ọbụghị nke a kpara akpa.

Aha onyonyo, Mbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa