Fr Mbaka: Ọ ginị mere ude ụkọchukwu a ji ede?

Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ebe foto si, Facebook/Adoration Ministry Enugu Nigeria

Nkọwa foto, Ụkọchukwu Ejike Mbaka
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu onye a kpụ n'ọnụ ugbua na Naịjirịa bụ ụkọchụkwụ ụka Katọlik bụ Fada Ejike Mbaka nke ọgbakọ ekpere "Adoration Ministries" di n'Enugwu.

Ihe Fada Mbaka mere na-ewu bụ amụma o buru maka mmeri Hope Uzodinma meriri n'Ụlọikpe Kachasị na Naịjirịa iji bụrụ aka na-achị Imo steeti.

N'ụka ọ kara na ngwụcha ọnwa Decemba eji gafeta ụbọchị mbụ nke Jenụwarị 2020, Mbaka kwuru na mgbanwe ga-abịa n'ọchịchị Imo steeti n'afọ 2020.

O kwukwara na "Chukwu ga-ehicha ndị Imo steeti anyammiri" maka na Hope Uzodimma ga-ewere ọchịchị dịka gọvanọ steeti ahụ.

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

Ka amụma a Mbaka buru pụtara ihe, soshal midia nwuuru ọkụ dịka ọtụtụ mmadụ, ọkachasi ndị na-akwado aka na-achi Imo n'oge ahụ bụ Emeka Ihedioha, gbarụru ihu maka amụma ya.

Onye na-eti egwu a ma ama bụ Charly Boy nakwa onye na-eme ejiji bụ Charles Awurum sokwa na ndị bara ezigbote mba maka okwu Mbaka.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Isiokwu ndị a na-akpo Mbaka aha bụ na amụma ya banyere Imo bụ amụma ụgha.

Mana ka chị jiri n'ụbọchị iri na ano nke ọnwa Janụwarị 2020, Ụlọikpe Ukwu na Naịjirịa nyere Hope Uzodinma ikike ị bụrụ aka na-achị Imo steeti.

Tupu Ụlọikpe Ukwu ekpee ikpe ahụ, onye a kpụ n'ọnụ bụ Mbaka, ka ụfọdụ na-asị na mkpebi ụlọikpe a ga-egosi ụdịrị amụma ọ na-ebu.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ebe ụfọdụ, dịka nwa amadị e ji Henry Shield mara na Twitter, na-ekwu na ọ bụ ozi ka e ziri Mbaka ka ọ mata etu ndi mmadu ga-esi wee nabata mkpebi ulọikpe ahụ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ka mkpebi a ruru ala, ụfọdụ na-ekwuzi na o gosiri na Mbaka na ndị na-achị Naịjirịa na-arụkọ, dịka ndi ọzo na-ekwu na ọ bụ ihe gosiri na o bụ ụkọchukwu ọpụrụiche.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ọkaiwu Chima Anozie bụ onye Imo steeti ma sokwara zuo ndọrọndọro onye ga-ebu ọkọlọtọ APC na ntuliaka nke 2019 kwenyere n'aka Mbaka dị na mmeri ha nwetara.

N'okwu o kwuru ka ụlọikpe kpebiri ikpe, ọkaiwu a sị na ka Mbaka buchara amụma ya, ya weputere ihe o ji ekpe ekpere were kpokuwe Chukwu.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Ụfọdụ ndị ụkọchukwu Katọlik anaghị akwado Mbaka

Aha onyonyo, 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere'

Onyeisi ụka katọlik na Legọs kwuru na amụma Mbaka adabaghị n'etu Ụka Katọlik si eme.

Bishọp Adewale Martins gwara BBC na ọ bụghị ihe ziri ezi etu Mbaka si akwado otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị hapụ onye nke ọzọ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na e nwere ike ịkwụsị ọgbakọ ekpere Mbaka ma ọ bụrụ na ọ kpachapụghị anya.

Mana ọtutụ ndị nkwado Mbaka na-ekwusi ike na Chineke ji ya arụ ọrụ.