Coronavirus: Mba China sị ka anyị ghara ikwu maka Coronavirus - Onye Naịjirịa nọ na China
- Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Dịka ọrịa coronavirus na-abawanye na Chaịna nakwa mba ndị ọzọ, otu nwata akwụkwọ Naịjirịa nọ na mba ahụ emepeela mpio etu ọnọdụ ha n'ebe ahụ si kwụrụ.
Chukwunonye (anyị edeghị ezigbo aha ya maka etu ihe si kwụrụ) gwara BBC Igbo na ọnọdụ ha na Chaịna, bụ ebe ọ na-agụ mahadum, adịghị mma ma ncha.
"Anyị ahụghị gọọmentị anyị anya nke anyị ji nụ ọnụ okwu ha"
"Nke bụ eziokwu bụ na ị bịa ebe anyị na-akpa nkata n'ekwentị, anyị na-ebe akwa n'ihi na anyị enweghi gọọmentị. Ihe anyị na-anụ bụ na gọọmentị Gana sị na ha ga-ezitere ndị be ha nọ akwụkwọ ebe ahụ Yuan puku iri ka ha jiri na-ego nri.
"Mana o nwebeghi etu anyị siri nụta n'ọnụ gọọmentị anyị. O nwere ndị na-ekwu na gọọmentị sị ka ha dekọta aha ụmụakwụkwọ Naịjirịa nọ na Chaina. Mana ihe anyị chọpụtara bụ na ndị mmadụ ji anyị agbagharị. Nke bụ eziokwu bụ na o nwebeghi ihe gọọmentị Naịjirịa gwara anyị."
N'agbanyeghị ihe Chukwunonye na-ekwu, onyeisi ngalaba na-ahu maka ọdịmma ndị Naịjirịa nọ n'ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa, sị na ha na-agba mbọ maka ndị tọrọ n'obodo Wuhan bụ ebe nje a gbugoro ihe karịrị mmadụ 300 malitere.
O dere mbọ ha na-agba n'akara Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N'agbanyeghị ihe odoziakụ Dabiri-Erewa dere, Chukwunonye na-ekwusi ike na onweghị onye ha hụrụ. Mana, ọ sịkwa na o nwereike bụrụ makana ọ bụghị na Wuhan ka ya na-agụ akwụkwọ.
"Ọ bụ na Wuhan ka ndị mmadụ tọrọ kpọmkwem. Onye butere ọrịa n'obodo ụlọakwụkwọ anyị dị enwetela ọgwụgwọ."
Ọ sị na n'agbanyeghị nke a, obi adịghị ha mma etu ọ na-enwebeghi ozi ọbụla ha nụtara n'ọnụ ndị na-achị Naijirịa.
"Ọ bụ ndị seputere isi nwereike isị na ha na gọọmentị anyị na-akpa.
"Ọ bụ ihe ihere na obodo dịka Naịjirịa na-ebute Chaịna ego agaghị achọ etu ha na ha ga-esi kwekọrịta mara etu a ga-eji nye aka...ọ bụrụgodi site n'inye ụmụakwụkwọ mkpuchi imi."
"Etu anyị si biri na Chaịna ugbua"
Chuwkunonye sị na ha anaghị esinwu ebe ha bi pụọ.
"Onye ọbụla nọ n'ọnọdụ Bekee kpọrọ Quarantine ugbua.
"A na-achọ igbochi mmadụ ịpụ gaa bute nje ahụ."
Ọ sị na ọ bụrụ na ị ga-apụrịrị ị ga-anata akwụkwọ ga-enye gị ikike ịpụ.
"Ị pụchaa lọta, a ga-enyocha gị ahụ ọfụma ma tinyekwa gị na quarantine bụ ebe ị ga-anọ ruo oge ha jiri hụ na ahụ dị gị mma tupu e kwe ka ị gaa ebe ndị ọzọ nọ."
Ọ sị na tupu ị gagharịa n'ebe ha bi, ị ga-eyiriri mkpuchi imi.
"Etu esi eri nri"
Chukwunonye sị na ụlọakwụkwọ ha haziri ndị ọ bụ ọrụ ha ịpụ gaa gote nri na ihe ndi ọzọ ndụ chọrọ.
"Nrị gị gwụ, i tinye akwụkwọ, ndị a họpụtara agaa gote nri."
Ọ sị na a na-eyichi ndị ahụ ahụ ọfụma tupu ha agawa njem a.
"A na-etinyekwa uche n'ebe ha na-aga na ihe ha na-ego iji hụ na ọ dị mma oriri, na-abụghị nke bu ọrịa."
Mmachi anyị ikwu maka ọrịa coronavirus
Chukwunonye sị na ọtụtụ mba abịala bịa buru ndị be ha lawa.
Mana, otu ihe o kwuru tụrụ anya bụ na mba Chaịna sị ka ha ghara ikwu maka nje a, ọkachasị ma ọ bụrụ ndị ntaakụkọ na-ajụ ajụjụ.
O gosiri ozi e ziteere ha site n'ihe mgbasaozi WeChat, na-akọwa na e nwere ndị ntaakụkọ si mba ofesi na-ajụ ụmụakwụkwọ a ajụjụ maka ihe na-eme na Chaịna.
Ozi a gwara ụmụakwụkwọ ka ha cheta na ha ekwesịghị ịsa ajụjụ ndị ntaakụkọ, dịka ọ bụ ndị na-ekwuru ụlọakwụkwọ ka ọ dịrị ịsa ajụjụ ọbụla.
Chaịna dị njikere maka nje a
Site n'ihe Chukwunonye kwuru, ndị nọ na mba Chaịna nakwa ha bụ ndị bịara abịa, ma ihe ha kwesịrị ịma maka igbochi nje coronavirus ifesa ha.
Ọ sịkwa na ihe ọ hụrụ bu na ya bụ mba na-agbasi mbọ ike ịhụ na ha meriri ya bụ nje.
Na Naịjirịa, minista na-ahu maka ahụike bụ Osagie Ehanire, sị na Naịjirịa dị njikere maka nje Coronavirus.
Akụkọ ga-amasị gị:










