Coronavirus: O nweghi onye nwere ọrịa a na Legọs - Gọọmentị

Ndị ọrụ ahụike na-enyocha ndị mmadụ ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Gọọmentị Legọs steeti ekwuola na ọbụghị eziokwu na e nwere onye na-arịa orịa corona virụs n'ụlọọgwụ ọbụla na steeti ahụ.

Ha kwuru nke a n'ihi asịrị malitere ifesa na Twitter mgbe otu onye kwuru na o nwere onye a chọpụtara bu ya bụ ọrịa n'ụlọọgwụ dị na mpaghara Lekki.

Akụkọ ahụ chọrọ ime ka egwu baa ọtụtụ ndị mmadụ n'ahụ.

Mana Kọmishọna na-ahụ maka ahụ ike bụ Akin Abayomi gwara BBC Igbo na nke ahụ bụ akụkọ ụgha.

Cheta na Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa bụ Osagie Ehanire ekwubuola na Naịjirịa dị njikere igbochi ọrịa coronavirus ịbata Naịjirịa.

Ehanire kwuru nke a n'ọgbakọ e nwere n'Abụja ụbọchị Fraịde iji kpaa ka a ga-esi gbochie arịa ọjọọ ahụ.

Gọọmentị etiti asaala Amerịka

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Twitter/@MBuhari

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari

Gọọmentị etiti ehibela kọmiti ga-eleba anya n'ihe mere mba Amerịka ji kwuo na ha ga-akwụsị inye ndị Naịjirịa visa ịbata obodo ha biri.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Mohammadu Buhari bụ Femi Adesina kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụrụ ụbọchị Satọdee.

Adesina kwuru na onyeisi kọmiti ahụ bụ mịnịsta na-ahụ maka nchekwa ime obodo bụ Rauf Aregbesola.

O kwukwara na kọmiti ahụ na gọọmentị Amerịka nakwa ndị uweoji mba ụwa (Interpol) ga-arụkọ ọrụ iji hụ na e mezuru ihe niile mba Amerịka chọrọ iji wepu Naịjirịa n'akwụkwọ ọjọọ ha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Nke a na-eme dị ka onye jibu ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa Atiku Abubakar rịọrọ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ka obi ya dajụọ n'ebe ụmụ Naịjirịa nọ.

Atiku rịọrọ arịrịọ a n'ozi o zigaara Trump n'akara Twitter ya.

Atiku Abubakar

Ebe foto si, Twitter/Atiku Abubakar

Nkọwa foto, Atiku Abubakar

O kwuru na obi dị ya mwute maka atụmatụ ọhụrụ Trump wepụtara nke machiri inye ụmụ Naịjirịa akwụkwọ ikike ịbata mba Amerịka nke ha nwere ike iji tinye akwụkwọ ịnọgide na mba ahụ.

Atiku rịọrọ Trump ka o cheta mmekọrịta Naịjirịa na mba Amerịka n'oge gara aga.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

O kwuru sị: "Amerịka kweịrị iwepụta atụmatụ iji taa ndị ọchịchị Naịjirịa ahụhụ maka amaghị eme ha, ọbụghị ịta ụmụ Naịjirịa niile ahụhụ."

Atiku kwukwara na ụmụ Naịjirịa hụrụ Amerịka n'anya ma bụrụkwa ndị mbịarambịara kacha gụọ akwụkwọ na mba ahụ.

Amerịka na Ọstrelia amachiela ndị njem si Chaịna

Ndị njem si Chaịna abata Rọshịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mba Rọshịa wepụtara ngalaba di iche ebe ndị njem si Chaịna alọta ga na-esi.

N'ihi egwu maka Corona Virus, mba Amerịka na Ọstrelia amachiela ndị abụghị ndị be ha si mba Chaịna abata obodo ha.

Mba ndị ọzọ machiri ndị njem si Chaịna bụ Japan, Pakịstan na Ịtali.

Rọshịa wepụtara ngalaba di iche ebe ndị njem si Chaịna alọta ga na-esi.

Mana otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' kwuru na mmachi ahụ adịghị mma maka na o nwere ike ịmetụta ndị so arụ ọrụ iji gbochie ya bụ ọrịa ịgbasa ụwa niile.

Liverpool buzi ezekwueche

Alex Oxlade Chamberlain

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Alex Oxlade Chamberlain nyere goolu mbụ nke ndị Liverpool

Ndị otu egwuregwu bọọlụ Liverpool ejirila ọkpụ goolu anọ asataghị asata wee merie ndị Southampton n'ehihie Satọde.

Nke a pụtara na ha jizi akara 22 agafe ndị Manchester City bụ ndị na-esote ha na tebulu EPL.

Onye ọbụla na-atụ anya na ọ bụ Liverpool ga-ebuli iko EPL nke afọ 2019/2020.

N'egwuregwu ndị ọzọ, Chelsea na ndị Leicester City nyere onwe ha ọkpụ goolu abụọ abụọ.

Everton gbara ndị Watford 3-2, ebe Bournemouth meriri Aston Villa 2-1.

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lai Mohammed

Lai Mohammed

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụ Naịjirịa kpụ mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed n'ọnụ maka ọ sị maghị ihe banyere iwu megidere Soshal Midia ndị ụlọomeiwu chọburu iwepụta na 2019.

O kwuru nke a mgbe onye ntaakụkọ bụ Tim Sebastian na-agba ya ajụjụọnụ n'emume ihe nkiri a kpọrọ 'Conflict Zone'

Mohammed sị na ọ nụtụbeghi maka iwu a ma jụọ 'Kedụ onye wepụtara iwu a'?

Nke a mere aha ya (Lai Mohammed) ji na-ewi na soshal midia.

Femi Fani-Kayode sị na Lai Mohammed tụrụ asị ọcha;

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Joe Mide kwuru na Lai Mohammed nwere obi ikwu ụdị okwu a;

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Cheta Sịnatọ Mohammed Sani Musa bụ onye kwadoro iwu a n'ụlọomeiwu n'ụbọchị ise ọnwa Nọvemba, 2019.

Iwu a sị na a ga-ama onye ọbụla zipuru ozi ụgha na soshal midia ikpe ọnwụ bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ.

Asụsụ Igbo abụrụla iwu n'Anambra

Obiano

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook

Nkọwa foto, Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ

Gọọmenti Anambra Steeti ekwusiela ike na asụsụ Igbo bụ asụsụ dị mkpa ụmụakwụkwọ niile ga-amụta na Steeti ahụ.

Kọmishịọna agụmakwụkwọ bụ Kate Omenugha sị na amapụtara ụbọchị Wednezde ọbụla dịka ụbọchị omenala Igbo n'ụlọakwụkwọ niile.

Amerịka na-amachiela ndị si Chaịna ịbịa be ha

Coronavirus

Ebe foto si, Getty Images

Mba Amerịka amachiela ndị mba ọzọ gara mba Chaịna na nso nso a ịbịta obodo iji kee nkwụcha maka ọrịa coronavirus.

Ha sịkwara na ha ga-akpachikọ ụmụafọ mba ha si mba Chaịna lọta ruo izuụka abụọ maka inyocha ha ahụ.

Nkeji ehihie

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Football Freestyle: 'Eji m iko bọọlụ enyere onwe m aka n'ụlọakwụkwọ'

Ihe Amerịka ji mechie inye Naịjirịa akwụkwọ njem

Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump amachiela ndị Naịjirịa ịbata bịa biri e biri na mba ha n'iwu ọhụrụ o tinyere bụ nke ọ sị na ọ bụ maka nchekwa.

Mba ndị ọzọ o metụtara gụnyere Eritrea, Myanmar, Kyrgyzstan ebe iwu a ga-amalite ọrụ n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Febụwarị 2020.

Odeakwụkwọ ngalaba 'Homeland Security' bụ Chad Wolf sị na nke a bụ iji lebanye na nchekwa etu ndị mba ndị a ji ekerikọta ozi n'etiti ha.

O kwuru na mba ndị a mara afọ n'ala n'ogogo ọnọdụ nchekwa mba Amerịka hiwere nye ha.

Ọ sị na a gaghị ekwe ndị si mba ndị amachiri itinye akwụkwọ ikike ime njem bịa biri n'Amerịka a kpọrọ 'Permanent Visa' na Bekee.

Wolf sị na iwu a agaghị emetụta ndị na-achọ ịbịa nlereanya, ndị azụmaahịa ma ọ bụ ndị bịara ịnara ọgwụgwụ maka ahụike.

Ihedioha na-akụ aka na tipa bu aja

Buhari na Uzodinma

Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter

Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti ekwuola na njem Emeka Ihedioha na aga ka ụlọikpe kachasị laghachị azụ n'ikpe ha kpere dịka mmadụ iti aka na tipa bu aja.

O kwuru nke a n'Abuja dịka o zutechara onyeisiala Buhari na nke mbụ kamgbe o were ọchịchị dịka gọvanọ.

Briten esila na European Union pụọ

Ndị Uk na-enwe aṅụrị maka ọpụpụ ha

Ebe foto si, Getty Images

Ndị n'ọchị ndị n'akwa dịka United Kingdom esila n'ọgbakọ European Union pụọ n'ikpeazụ mgbe ha nọchara afọ iri anọ na asaa n'ime ya.

O were United Kingdom ihe karịrị afọ atọ iji mee ntuliaka maka ọpụpụ ha. mana ajụjụ dị ndị mmadụ n'ọnụ bụ kedụzie ihe ọzọ ugbua ha pụrụ?

N'egwuregwu

Odion Ighalo

Ebe foto si, Getty Images

Manchester United azụọla nwafọ Naịjirịa bụ Odion Ighalo site n'aka ndị Shanghai Shenhua na mbinye a kpọrọ Loan na bekee.

Ighalo dị afọ iri atọ ga-agbara Man United bọọlụ site ugbua ruo ngwụcha oge asọmpi a nọ n'ime ya.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile