US Visa Fee: Lee ego ole ọ ga-efu gị inweta 'visa' Amerịka

Visa Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Malite n'ụbọchị Tọọzde, abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọgọst afọ 2019, ọnụ ego e ji enweta "visa" mba Amerịka ga-arị.

Nke a bụ ozi ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka wepụtara n'ụbọchị Tuuzde.

Ha kọwara na iwu ala ha kwuru na ha ga-akpaso mba ọbụla agwa etu mba ahụ si akpaso ha agwa.

E mee e megwara anaghị apụ okwu

Onyeisiala Buhari na Trump
Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjiria Muhammadu Buhari na onyeisiala mba Amerịka Donald Trump

Dịka akwụkwọ ozi ahụ si kọwaa, a na-ana ndị mba Amerịka ego dị elu tupu ha enweta akwụkwọ ịbata Naịjirịa.

"Ọnụ ego ọ na-ewe onye Amerịka inweta "visa" Naịjirịa dị elu karịa ọnụ ego ọ na-ewe ndị Naịjirịa inweta "visa" Amerịka."

"Kamgbe mbido afọ 2018, gọọmentị Amerịka na-arịọ gọọmentị Naịjiria ka a gbanwee nke a."

"Mana dịka ọnwa iri na asatọ gachara, gọọmentị Naịjirịa agbanwebeghi ya."

"Nke a mere ngalaba a kpọrọ "U.S. Department of State" wepụta ọnụ ego ọhụrụ ndị Naịjirịa ga na-akwụ na "visa" Amerịka."

Akwụkwọ ozi ahụ kọwakwara na ọbụ naanị ndị akwadoro "visa" ha ga-akwụ ụgwọ ọhụrụ a e tinyere.

Onye ọbụla akwadoghi "visa" ya agaghị akwụ ya.

Ọ gakwara n'ihu kọwaa na onye Naịjirịa ọbụla ga-akwụrịrị ụgwọ ọhụrụ a tupu e nye ya "visa" ọhụrụ, agbanyeghi obodo ọbụla onye ahụ nọ wee tinye akwụkwọ.

Ma nwata ma okenye ga-akwụrịrị ya bụ ụgwọ.

Ọ bụkwa n'ụlọ "embassy" nke Amerịka ka a ga-akwụ ụgwọ ahụ, ọbụghị n'ụlọ akụ.

Ego ole bụ "visa" Naịjira

Ọnụ ego "visa" Naịjiria

Ebe foto si, immigration.gov.ng

Onye Amerịka chọrọ ịbịa Naịjirịa ga-akwụ $160 (N59,200) iji gbata "visa".

Ọ bụrụ onye bịara ịrụ ọrụ, onye ahụ ga-akwụkwa $160 ọzọ iji gbata ikike a kpọrọ "Temporary Work Permit" (TWP).

E nwekwara ego ọzọ ($160) nke a kpọrọ "Subject to Regularization (STR) Visa Fees".

Ha niile pụtara $480 (N177,600) ma ọ bụrụ onye Amerịka bịara ịrụ ọrụ na Naịjiria.

Onye bịara naanị maka nleta maọbụ nlereanya ga-akwụ $320 (N118,400).

N'agbanyeghi ego ndị a, ego Amerịka na-ana ndị Naịjirịa tupu ha abata, pekarịrị ego ole ndị mba Briten na-ana ndị Naịjirịa tupu ha abata.

Lee ihe gosiri nke a:

Ego ole UK na-ana Naịjiria maka visa
Nkọwa foto, Dịka ukvisa.blog si dee n'ọnwa Epreelụ nke afọ 2019, Naịjiria na-akwụ dọla 129 maka visa Briten, mana ọ bụ dọla 121 n'ọnwa Ọgọstụ

Ego ole ka "visa" Amerịka bụ?

Ego ole a gbakwunyere na ọnụ ego "visa" Amerịka:
Nkọwa foto, Lee ego ole a gbakwunyere na ọnụ ego "visa" Amerịka. Otu dọla pụtara N370 dịka ha sị tụgharịa ya.

Visa B1/B2 bụ nke a na-enye ndị na-aga Amerịka maka azụmaahịa, ebe F1/F2 bụ nke ụmụ akwụkwọ.

Ọnụ ego ha bụbu $160 (N59,200). Ugbua a gbakwụnyela ya $110 (N40,700).

Nke a pụtara na onye e nyere visa a ga-akwụzi $270 (N99,900).

Visa ogoogo "H" bụ nke nwa mgbe nta a na-enye ndị ọrụ kwa mgbe maọbụ ndị gara ọzụzụ na-agaghị anọte aka.

Ọnụ ego ya bụ $190 (N70,300). Ugbua, agbakwụnyela ya $180 (N66,600), nke pụtara $370 (N136,900).

Etu e si tinye ego n'ọnụ ego "visa"
Nkọwa foto, I ga-ahụ ọnụ ego ndị na webụsaịt ndị ụlọ nnọchite anya Amerịka na Naịjiria.

Visa ogoogo "I" bụ nke a na-enye ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ mgbasa ozi.

Ọnụ ego ya bụbu $160 (N59,200). Ugbua a gbakwụnyela ya $210 (N77,700), nke pụtara $370 (N136,900).

Visa ogoogo "L" bụ nke a na-enye ndị ụlọọrụ ha wegara na mba Amerịka (Intracompany Transferees).

Ọnụ ego ya bụbu $190 (N70,300). Ugbua a gbakwụnyela ya $303 (N112,110), nke pụtara $493 (N182,410)

Visa ogoogo "R" bụ nke a na-enye ndị ọrụ okpukperechi.

Ọnụ ego ya bụbu $190 (N70,300). Ugbua a gbakwụnyela ya $80 (N29,600), nke pụtara $270 (N99,900).

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Ndị mmadụ na-etinye ọnụ na mbuli ọnụ ego "visa" a.

@adeyanjudeji kwuru na ụmụ Naịjirịa ga-amarịrị ihe.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@paul_nwachukwu kwuru na nke ahụ gosiri na onweghizi mba na-akwanyere Naịjirịa ugwu.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mana @woyet kwenyere na gọọmentị Naịjirịa bu ụzọ chọọ okwu.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Nwata nwoke nne na nna ya bụ ndị ogbu, ji mkpịsị aka ha akparịta ụka.