Amerịka ebuliela mmachi ha machiri ndị gbara ọsọndụ

Ebe foto si, Reuters
Ndị ọrụ gọọmentị mba Amerịka na-ekwu na ha ebuliela mmachi ha machiri ndị gbara ọsọndụ na-esi mba iri na otu abata obodo ha.
Mana, onye ode akwụkwọ ndị Homeland Security na Amerịka bụ Kirstjen Nielsen sị na ndị si mba ndị a ka ga-agabiga ule 'ihe ize ndụ' (risk-assessment) nke ga-egosi ma ha enwere ike ịkpa ike ma ha bata Amerịka, tupu enye ha ohere ịbata.
Ọchịchị Donald Trump tinyere mmachi a metụtara mba iri ndị na-ekpe alakụba na mba North Korea, n'ọnwa Oktoba 2017.
Nwaada Nielsen kwuru sị "ọ dị anyị mkpa ịmata onye na-abata".

Ebe foto si, Getty Images
"Ihe mgbakwunye nchekwa ndị a ga-eme ka ọ ghara ịdịrị ndị ọjọọ mfe imebicha atụmatụ ndị gbara ọsọ ndụ anyị nwere, ọ ga-emekwa ka anyị nwee ike si ụzọ ihe ize ndụ ndị ọzọ chekwaa obodo anyị."
Obodo ndị ọ metụtara:
N'agbanyeghi na-akpọbeghị obodo ndị a aha, otu ndị gbara ọsọ ndụ kwuru sị na mmachi a metụtara obodo ndị dịka Egypt, Iran, Iraq, Libya, Mali, North Korea, Somalia, South Sudan, Sudan, Syria na Yemen.
N'ime afọ atọ garaaga, ihe ruru ndị pasentị iri anọ bụ ndị gbara ọsọ ndụ batara mba Amerịka si n'obodo iri na otu a.
Ka Trump manyechara iwu mmachi a n'ọnwa Oktoba, ọnụọgụgụ ndị a gbara ọsọ ndụ gbabata Amerịka kebiri ekebi site na puku iri anọ na ise (45,000) ruo iri abụọ na atọ (23), dịka Reuters siri kwuo.









