Minimum wage: Lee mgbe anyị ga-ebido kwụwa ndị ọrụ anyị

Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto, Ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ

Ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ nke bụ puku naịra iri atọ (N30,000), ka na-apụta okwu.

Ndị otu jikọrọ ndị ọrụ Naijiria bụ "Nigeria Labour Congress" nọ n'ọgbakọ ha Ụbọchị Monde baa mba ma dọọ gọọmenti aka na ntị ka a malite kwụwa ha opekatampe ọhụrụ ahụ.

N'aka nke ọzọ, akụkọ kọkwara na gọọmenti Kaduna Steeti ga-amalite ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ n'ọnwa Septemba.

Mana ndị gọọmentị Ọwụwa Anyanwụ kwuru na ha ga-amalite ịkwụ ụgwọ a mgbe ọbụla gọọmentị etiti bidoro ịkwụ ya.

Dịka C-Don Adinuba, kọmịshọna mgbasa ozi na Anambra State, siri kwuo, Gọvanọ Willie Obiano kwetara na ọ ga-akwụ ụgwọ ahụ.

Don Adinuba
Nkọwa foto, C-Don Adinuba, Kọmishọna mgbasa ozi n'Anambara Steeti.

Mana ọ ga-abụ ma gọọmentị etiti na ndị NLC kwekọrịtachaa.

"Gọọmentị etiti ewepụtabeghi usoro a ga-eji kwụọ ya bụ ụgwọ."

"A ka na-eme nkwekọrịta ahụ n'Abuja."

"I kwụọ onye "level 1" puku naira iri atọ, ego ole ka ị ga-akwụ onye 'level 2' na 'level 3'?

"Mgbe ọbụla e wepụtara nkwekọrịta, anyị ga-amalite kwụwa."

Emma Uzo
Nkọwa foto, Emma Uzo, onyeisi ntaakụkọ nke gọvanọ Dave Umahi

Emmanuel Uzo, onyeisi mgbasa ozi nke Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi, kwukwara otu ihe ahụ.

"O nweghị mgbe gọvanọ Ebonyi ji kwuo na ọ gaghị akwụ.

"Kama nwata agaghị ebu nna ya ụzọ mụta diọkpara."

"Anyị na-eche ka gọọmentị etiti bido kwụwa tupu anyị ebido."

Uzo kwukwara na gọọmenti kwesịrị ibuli ego a na-enye steeti ọbụla kwa ọnwa.

Nke ahụ ga-enye aka ma a malite ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe ọhụrụ a.

Ndị ọrụ NLC

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị ọrụ NLC na-eme ngagharịiwe.

Ka ọ dị ugbua, o nwebeghị onye ma mgbe ndị ọrụ n'ala Igbo ga-esoro ibe ha rachawa pịọm.

Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari enyere iwu ka e bido ịkwụ ndị ọrụ gọọmentị etiti ụgwọ opekatampe ọhụrụ.

Mana nke ahụ metụtara naanị ndị ụgwọ ọnwa ha erubughi puku naịra iri atọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba.