Enugu Insecurity: Lee mmadụ ole e gburu maọbụ tọrọ n'Enugwu steeti na nsonso a

O nweburu mgbe a na-elegara Enugwu Steeti anya dịka steeti kacha nwee udo na Naijiria.
Mana na ọ dịghịzị otu ahụ ugbua n'ihi na ọ dị ka ihe niile gbasara nchekwa na steeti ahụ aghasaala.
N'isi ụtụtụ ụbọchị ụka, abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Ọgọst afọ 2019, ka ndị omekome wakporo otu ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu.
Mana ọ bụghị sọ nke ahụ, lee ugboro ole ndị omekome gburula maọbụ tọrọ ndị mmadụ na steeti ahụ:
1. Fada Clement Ugwu

Ebe foto si, Chioma Obianinwa
Ndị ntọ tọọrọ Ụkọchukwu Clement Ugwu n'ụlọ ya n'ọnwa Maachị.
Ugwu na-arụ ọrụ n'ụlọụka St Marks Katọlik Church Obinofia Ndiuno, n'okpuru ọchịchị Ezeagu.
Akụkọ kọrọ na ndị ntọ ahụ wekọọrọ ego niile dị n'ọba ego ụkọchụkwu ahụ ma mechaa gbuo ya.
E mechara ndị uweojii kwuo na aka akparala ndị gburu ụkọchukwu ahụ.
2: Fada Ikechukwu Ilo
Ndị omekome wakporo Ikechukwu Ilo n'okporo ụzọ sị Nenwe aga n'ime Enugwu.
Mana Ilo, onye bụ ụkọchukwu Katọlik n'arụ ọrụ na St Patrick, Nome, kwuru na ọ bụ ndị Fulanị wakporo ya".
Ha gbatara ya ebe, mana ọ nwụghị.
E bugara ya n'ụlọọgwụ 'Annunciation' dị n'Emene Enugwu ebe ọ nọ nata ọgwụgwọ.
3: Fada Paul Offu

Ebe foto si, Blessing Nwobodo Itua
Paul Offu bụkwa ụkọchukwu ọzọ na-arụ ọrụ n'Enugwu nke ndị omekome wakporo ma gbuo.
Ọ bụkwa ndị a na-eche na ha bụ ndị Fulani gburu Paul Offu na Clement Ugwu, ndị Uweojii sị na ha nọzị ha n'aka
Ogbugbu Offu gbawara ndị ụkọchukwu ụka Katọlik nọ n'Enugwu obi.
Nke a mere ka ha mee ngagharị iwe ma kpọọ oku ka ndị Fulani ọchịehi niile nọ n'Enugwu kwara laa.
Ndị uweojii kwukwara na ha anwụchiela ndị aka ha dị n'ọnwụ ụkọchukwu ahụ.
4. Igwe ndị Agbaogugu na nwunye ya

Ebe foto si, Nwafor Chiedozie
Ndị ekperima tọọrọ Igwe Sunday Orji, Eze ndị Obom Agbogugu dị n'okpuruọchịchị Awgu, Enugwu Steeti n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọst.
Eze ahụ na nwunye ya nọrọ abalị olemole n'aka ndị ntọ ahụ tupu a tọhapụ ha.
5: Regina Ugwu
E gburu Regina Ugwu oge ọ gara ọrụ ugbo ya n'obodo Nchatancha Nike, Enugwu East LGA Enugwu Steeti.
Nke a mere n'abalị iri abụọ n'otu nke ọnwa Ọgọst.
Ọ bụ mgbe ọ lọtaghị ọrụ n'oge ka ndị mmadụ bidoro chọwa ya.
E mechara chọta ozu ya ebe e ji mma wee sụkachaa ya ahụ.
Nke a butekwara ngagharịiwe na mpaghara ahụ, mana gọọmentị mechara kwe nkwa na ha ga-ahụ isi ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Lee ihe nkiri ga-amasi gị:












